Lagos Trade Fair: O nweghị onye kpọchiri ahịa anyị - Onyeisi Ahịa 'Trade Fair'

Ndigbo na-azụ ahịa n' Aspamda na-eme ngagharịiwe

Onyeisi ahịa Lagos International Trade Fair bụ Tony Obi ekwuola na o nweghị eziokwu dị n'akụkọ na Lehgọs steeti ewegharala ahịa ahụ.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na nwa Ahmed Tinubu, onyeisi pati APC mabụrụkwa eze ahịa niile dị na Legọs steeti bụ Folashade Tinubu Ojo ewegharala Ahịa 'Trade Fair' ma nye iwu ka e mechia ahịa ahụ.

Mana na mkparịtaụka Tony Obi na BBC nwere n'ekwentị, ọ kwuru na o nweghị ihe yiri nke a merenụ.

Obi sịrị, "Ọ bụghị eziokwu. O nweghị ihe dị otu ahụ na-eme n'ebe a.Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu Folashade Tinubu Ojo n'okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị.

Cheta na izu ole na ole gara aga, ndị ahụ mere ngagharịiiwe iji gọsị na ọ gaghị adị ha obi mma ma gọọmenti etiti nye gọọmenti Legọs steeti ahịa ahụ nke ha gbazirzinyere ndị ahịa afọ 50.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionTrade Fair: Ọ bụrụgodi na gọọmenti etiti chọrọ ire ọdọ ahịa a, ndị Igbo ga-egonwu ya'

Akụkọ ndị ga-amasị gị: