Nurse murder: Ndị ọrụ 'Psychia' n'Enugwu akwaala arịrị maka ọnwụ onye otu ha

Ụlọọgwụ

Ụlọọgwụ Psychiatric Enugwu nọ n' iru uju ugbua maka ọnwụ Maria Amadi bụ onye isi ngalaba ndị nurse na ya bụ ụlọọgwụ.

Njinji ahụ jiri n'izu ụka gara aga oge ojiegbe egbu gbaturu nwaanyị ahụ ka ọ latara n'ụlọ ya.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Ebere Amaraizu kọwara na ka ya bụ nwaanyị lọtara n'ụlọ ya, gbapee ụzọama ya ka ndị ahụ na-echebu ya jiri gbaa ya egbe.

E buru ya gawa ụlọọgwu Parklane Enugwu, ebe ahụ ka ọ nọ kubie.

Kọmishọna ndị Uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kwuru na aka akparala mmadụ abụo e chere na ha so gbuo nwaanyị ahụ.

Balarabe yọrọ ndị mmadụ ka ha dere jụụ ma zitere ndị uweojii ozi ihe ha na-enyo enyo na gburu gburu ha.

Ọnwụ Amadi bịara dịka ya na ndị isi ọrụ ha ndị ọzọ kụkọchara isi gbasara ụmụakwụkwọ  ndị si 'School of Nursing' were pụta bụ nke Maria sị na ha agaghị arụ ọrụ na 'Psychịa' maka na ha etozughị etozu. Maria bụ onye isi ndị Nursing services bụ ndị ọdị n'aka ịhụ maka ịleta ndị ejighị ahụ n'ụlọọgwụ ahụ.

Ndị ọrụ na Federala Psychiatric Hospital  na-achọghị ka akpọ aha BBC igbo sị na ihe ha jiri mara Amadị bụ "Madam Integrity" nke bụ na ọ naghị etinye aka maọbụ  kwado ihe nrụrụaka ọbụla.

Ha kwuru na ihe mere Maria ji ju iwe ụmụakwụkwọ ndị ahụ 'School of Nursing' zụpụtara bụ maka na gọọmentị napụrụ ha ikike ịzụ nd ị nọọsụ maka na ha ezughị ezu na nkụzị akwụkwọ ụmụ nọọsụ.

Dịka ka ha sịrị kwụọ bute ọgbaghara na  ya bụ ụlọọrụ.

Mgbe BBC gakwuru CMD ọhụrụ nke ụlọ "Federal Neuropsychiatric Enugwu" Dr Iteke Obiora gwara anyị na ọ ka bụ ọnwa abụọ ka ya rụrụ ọrụ dịka onyeisi.

Iteke kwuru na-ekpokobaala otu ga-etinye ya bụ ihe ọnụ.

Ndị ọrụ na ya bụ ụlọọgwu ji maka ọnwụ onyeisi ndị Nurse bụ Maria Amadi guzobe ekpere n'ọdọ ụgbọala ya bụ ebe.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a