Certificate of Return: APC akwọpụla aka n'isi Rochas?

Rochas Okorocha Image copyright Rochas Okorocha Facebook
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha nọ n'agba nke abụọ dịka Gọvanọ Imo steeti

Odee akwụkwọ pati APC bụ Lanre Isa-Onilu agwaala ndị ntaakụkọ na ha agaghị enyerenwu Rochas Okorocha aka ịnwete asambodo mmeri ya.

Ọ kwuru na ọ bụ maka na ha kwụsitụrụ ya ọrụ mere na ya bụ Okorocha enwebeghị ọnụ ịbia kpesara pati ahụ ihe gbasara asambodo mmeri ya.

Onilu kwuru na ọ bụrụ na nkwụsị ọrụ Rochas bie, pati etinye ọnụ n'okwu ya.

Cheta na Inec jụrụ ịnye Rochas Okorocha asambodo mmeri ya n'ụlọomeiwu ukwu maka ebubo imagide onye ọrụ Inec dịka onye meriri ntuliaka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: