Gunnar Solskjaer: E meela nwa amadị ahụ onye nchịkọta Man. Utd

Ole Gunnar Solskjaer Image copyright Getty Images

Otu egwu bọọlụ Manchester United enyela Ole Gunnar Solskjaer ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ha maka afọ atọ.

Ndị Man. U nyebụrụ nwa amadị ahụ nwa ọrụ kemgbe ọnwa Disemba ka ha chụchara Jose Mourihno.

Oge Solskjaer bidoro ọrụ, Man.U nọ n'ọnọdụ nke isii na 'Premier League' ma were pọịnt 11 achụ ọkwa nke anọ.

Mana ugbua naaní otu gboro ka a gbagburu ha n'asọmpí 13 ha na Arsenal sọkọrọ n'ọnwa, ebe ha ji naanị pọint abụọ achụ ndị Arsenal ndị n'ọnọdụ ikpeazụ na Champion League.

Solskjaer gbaburu Man.U bọọlú agba 11 ma nyere ha goolu nyere ha mmeri na 'Champion League' afọ 1999.

Solskjaer na obi bú ya sSolskjaer nnu maka ihe a mere.

"Nke a b m na-arọ nrọ ya kemgbe. ihe nke atọgbuola m na m ga-achịkọta otu egwu a ogologo oge."

"Bido n'ụbọchị mbụ m bidoro, ọ dị m ka onye nọ n'ụlọ ya. Ọ bụ ihe nkwanye ukwu ịgbara Manchester United bọọlụ ma bidokwa ọrụ dịka onye nchịkọta na ya."

"Onwa ole na ole gara aga dị m ịtụnanya."

Úfódú ndí ihe Man.U na-amasí achóghí Ole

Oge Solskjaer bidoro, ụfọdụ ndị ihe Man.U na-amasị ekwenyechaghị na ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara