Nnamdi Kanu: Ọ kaa gọọmenti obi, ha gaa nwụchie Kanu n'ala nsọ - Ụkọchukwu Peace

Nnamdi Kanu Image copyright Getty Images

Ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Peace Chukwudi ekwuola na ihe mere mba Naịjirịa ji chọọ inwụchi onye ndu Ipob bụ makana ndị ọchịchị na-eme ihe masịrị ha n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.

O kwukwara na ndị ọchịchị Naịjirịa kwesiri ijụ ihe mere ndị agha Naịjiria ji wakpo be Nnamdi n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

Ụkọchukwu Peace kwuru na ha na-ele anya ka ha hụ ka ndị ọchịchị ga-esi ga nwuchie Nnamdi Kanu n'ala Israel.

Cheta na ihe mere ụlọikpe ukwu dị n'Abuja jiri nye iwu ka anwụchigharịa onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bụ maka abịaghị ụlọikpe ugboro ugboro.

Jọstịs Binta Nyako bụ onye nyere mkpebi a n'ụbọchị Tọzde.

A tohapụburu Kanu na mkpọrọ n'afọ 2017.

A chọwara ya achọwa dịka ndịagha gbachara 'Egwu Eke' nke abụọ n'Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu na BBC Igbo

Mana o mechara, pụta ife na mba Israel onwa ole na ole gara aga ebe ọ nọọ gbasara ndị na-eso ya ozi.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere ọnwa ole na ole gara aga, kanu kwuru na o nweghị ihe ya mere ndị agha jiri wakpoo ụlọ nna ya n'Umuahia oge 'Egwu Eke'.

"O nweghị ụzọ ọbụla m siri mejọọ ha, o nweghị iwu ọbụla m dara."

"Na m sị ụlọikpe pụta ha sị na m agaghị ekwu okwu, na m agaghị agagharị kele ndị mmadụ."

Akụkọ ka na-abịa

'Ịmachị Ipob dịka otu na-eyi ndụ egwu, hapụ Miyetti Allah adabaghị'

Image copyright Getty Images

Otu jịkọrọ ndị na-ede edemede banyere ikike dịrị onye nke a kpọrọ 'Human Rights Writers Association of Nigeria( HURIWA)' adụọla onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ka ọ kwụsị ịkpa oke n'ọchịchị ya site na ịmaghapụ mmachi a machiri otu Ipob.

HURIWA akpọrọ onyeisiala Buhari oku ka ọ kwụsị atụmatụ ikpa oke n'ọchịchị ya ma nye mpaghara ọbụla oke ruru ha n' ịhọpụta ndị ọ ga-etinye n'ọkwa n'agba nke abụọ nke ọchịchị ya.

Huriwa kwuru na gọọment machiri ndị Ipob ndị ebughị egbe maọbụ ngwaagha ọbụla azọ nnwereonwe Biafra , ma hapụ ndị ọchịehi ndị gburuola ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụnwaanyị na na ndị okenye. n'Etiti-Ugwu Naijiria ha na-akpa ike na enweghị ntaramahụhụ ọbụla.

Ha katọkwara Buhari maka ịkpa oke na ndị o nyere ọkwa n'ọchịchị ya.

N'ozi nke onyeisi mgbasaozi ha bụ Emmanuel Onwubikoe wepụtara, Huriwakatọrọ ogbugbu e gburu ndị otu Ipob oge ha mere ngagharịiwe na Onicha, Aba nakwa ụmụahịa tupu nakwa oge 'Egwu Eke' agba nke abụọ na agbanyeghị na o nweghị ngwaọgụ ha ji, ebe n 'aka nke ọzọ, ha na ndị ọchịehi na-enwe mkparịta ụbụbọ.

Huriwa kwuru na gọọmenti banyere ndị agha kpara mkpamkpa aja n'ukwu site n'ịgba ha nkịtị.

Cheta na gọọmenti etiti machiri otu Indigenous People of Biafra nke a kpọọ Ipob n'aha ịchafụ n'afọ 2017 site ozi onyeisi mgbasa ozi ndị ọrụ nchekwa bụ Major John Eneche wepụtara nke boro Ipob ebubo "ihiwe ndị ọrụ nchekwa nzuzo,(Biafra Secret Service), ịnọchi okporoụzọ nakwa ị na- anapụ ndị mmadụ ego.'

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a