2019 Election: INEC eforola ntutu taa n'isi Rochas Okorocha

Akụkọ dị mkpa:

Inec eforola ntutu taa na ha enweghi ike inye Rochas Okorocha zọrọ oche sinetọ Ideatọ Saụt, asambodo mmeri ya.

Ebe foto si, Facebook/Rochas

Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec, kwuru n'Ọka na ndị a ga-enye asambodo bụ ndị kwụwara aka ha ọtọ na ntuliaka.

Ọnọdụ Donald Duke ugbua,

Donald Duke enwetala mmeri n'ụlọikpe kacha elu na Naịjirịa, dịka onye ji ọkọlọtọ SDP azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019.

Ebe foto si, Getty Images

Ugbọ ya gbara leti makana e mechaala ntuliaka ma họpụta onyeisiala, mana ụlọikpe nyere ikike sị ka a kwụọ ya nde Naịra atọ (N3m) iji tie ya aka n'obi.

N'ofesi,

Gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma.

Dịka a na-ekwu, ndị omeiwu mba Briten ajụla itinye aka n'akwụkwọ ga-eme ka ha si mba UK pụọ bụ ihe a kpọrọ "Brexit".

Ndị jụrụ ajụ ji vootu narị atọ na iri anọ na anọ (344) ebe ndị kwenyere na ha ga-apụ ji narị abụọ na iri asatọ na isii (286) maa afọ n'ala.

N'egwuregwu,

Ị ma na Iko asompi Uefa ga-awụchi Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images

Carlos Puyol gbaara Barcelona Bọọlụ bu ya bụ iko abịa njem nleta n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Epreelụ.

Ya bụ iko ga-abịa ya bụ njem na Legọs nakwa Uyo.

Ebonyi steeti,

Odeakwụkwọ ukwu Inec Ebonyi Steeti bụ Andy Ezeani gwara BBC Igbo na Inec Ebonyi steeti ataala ụkwa jaa eze n'ihe gbara ntuliaka 2019.

Nkọwa foto,

Oliver Osi onye nọchite anya ọgbọnta vootu Ivo ebe ọ na-etinye aka n'akwụkwọ mgbe ọ nwetere asambodo ya

Inec nyere ndị meriri na ntuliaka 2019 asambodo ha iji wete ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị na njedebe.

Mmeme a bụ nke naanị ndị omeiwu mmeriri bịara gara ụbọchị Tọzde.

N'okwu ya, Andy Ezeani kwuru na "ihe niile gara werewere mana Gọvanọ abịaghị".

Mgbe anyị jụrụ ya ka ọ bụ na Gọvanọ amaghị na a ga-enye asambodo ụbọchị ahụ, Ezeani zara na "mgbe anyị ji nweta ikike n'Abuja ịme ya bụ ihe, anyị kpọrọ Gọvanọ Umahi bụ onye sị na ya anọghị na Naịjirịa mgbe ahụ, na ya gara ezumike n'ala Bekee."

Ezeani sị na a ga-enye Umahi asambodo nke ya mgbe ọ lọtara.

Ahmadu Fintri nke PDP eturula ụgọ n'Adamawa

Ebe foto si, Twitter/Atiku

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec n'ịchafụ apọpụtala Ahmadu Fintri nke PDP dịka onye meriri mmeju ntuliaka e mere na Adamawa ụbọịchị Tọzde.

Fintri onye meriri na ọnọdụ vootu 44 dị n'okpuru ọchịchị 14 ebe e mere ntuliaka ahụ meriri Bubrilla Bindow nke APC.

O nwetara vootu 376,552, ebe Bindow nwetara 336,386 votes.

N'otu aka ahụ, Abdulazeez Nyako gbara onye nke atọ dịka o nwetara 113,237.

Cheta na Inec kwuburu na ntuliaka gọvanọ e mere n'abalị itoolu nke ọnwa maachị 'ezughị ịkpọpụta mmeri.

Emume ụbọchị ọmụmụ Tinubu

Ebe foto si, Ileowo Kikiowo

Nkọwa foto,

Ihe ọmụmụ Tinubu haziri maka ncheta ọmụmụ ya ụbọchị 28 nke ọnwa atọ n'afo 2019.

Onyeisiala Muhammadụ Buhari abịaghị emume ncheta ọmụmụ Ahmed Tinubu agbanyeghị na e butere ya n'Abuja.

Ntuliaka Adamawa

Ebe foto si, TWITTER

N'Adamawa Ahmadu Fintiri nke PDP ewerela vootu dị puku narị atọ na iri

asaa na isi na ụma (376,552) merie Jibrilla Bindow nke APC nwere vootu pụkụ narị atọ na iri atọ na ụma (336,386).

Gonzalo Higuain awusala ọwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Gonzalo Higuain

Gonzalo Higuain awụsala ọwa n'ihe gbasara ịgbara ndị mba Ajentina bọolụ.

Higuain dị afọ iri atọ na otu kwuru na ọ chọrọ igbado anya n'ịgbara Chelsea bọọlụ ugbua.

Gee nkeji Igbo ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị ebe a

Aha onyonyo,

Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo.

Akụkọ ga-amasị gị