Sex for marks: Aka akparala onye nkuzi na-eme ka nwata akwụkwọ rachaa ya utu tupu o bufee ya

Nwata akwụkwọ Image copyright Getty Images

Ndị uweojii kwuru na onye nkuzi a ma dịka Akintunde Ajayi, na-amagide nwatakịrị ahụ dị afọ 18, ka ọ rachaa ya utu tupu o bufee ya n'ule.

Ha kwuru na ihe a na-eme n'ụlọakwụkwọ Fazir-I-Omar dị n'Iwaya dị na mpaghara Yaba dị na Legọs steeti.

Ka BBC kpọtụrụ ndị uweojii Legọs steeti, Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuchitere ha kwuru na ha anwụchiela onye nkuzi ahụ dị afọ 39 n'ezie, na-enyocha ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ otu nwata akwụkwọ obi kara kwulitere okwu na onye nkuzi ahụ na-abagide ụmụagbọghọ ụlọakwụkwọ a.

Nwata akwụkwọ ahụ kwuru na onye nkuzi ahụ bụ onye a na-atụ ụjọ maka etu ọ na-esi amaja ụmụakwụkwọ.

O kwukwara na ọ na-abụ ụlọakwụkwọ chọọ ịgbasa, o nye ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị iwu ka ha bịakute ya n'ụlọorụ ya; bụ ebe ọ ga-anọ chebiri ka ụlọakwụkwọ gbasaa ọfụma nakwa ka ndị mmadụ lasachaa.

Nwata ahụ kwuru na ọ na-ebu ụzọ chọọ idina ha, mana ha jụ, ọ mee ka ha rachaa utu ya.

O kwuru na onye nkuzi a malitere ime ya ihe a oge ọ ka nọ na SS1, megide ya gafee mgbe ọ nọ SS2.

Onye nkuzi ahụ gọrọla ụkwụ ya na aka ya, kwuo na ọ naghị eme ihe e boro ya, kama na nwata akwụkwọ ahụ boro ya ebubo bụ onye a ma ama na-edina ụmụakwụkwọ ụmụnwoke ibe ya.

Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụzị bụ "kedụ etu o si mara na ọ na-edina ụmụakwụkwọ ndị ọzọ"?

Ndị uweojii kwuru na ha ezigala ụfọdụ ndị ọrụ ha n'ụlọakwụkwọ ahụ ka ha gaa legharịa anya ma chọọ ma e nwere ụmụakwụkwọ ndị ọzọ onye nkuzi a na-abagide na-abụghị naanị onye nke kwulitere okwu.

Akụkọ ga-amasị gị: