Imo state: Ndị uweojii ejidela onye ha na-enyo gburu ọkaikpe n'Imo

Onye a na-enyo enyo
Nkenke aha onyonyo Onye a na-enyo enyo na o gburu ọkaikpe

Ndị uweojii Imo steeti gosiri agbaala n'anwụ Friday Nnaekezie bụ otu nwoke gbara afọ 34, a na-enyo na aka ya dị n'ogbugbu e gburu otu ọkaikpe nke ụlọikpe Majie dị n'Uburu, n'okpuru ọchịchị Oru-West.

Ndị ntọ mmadụ amaghị ndị ha bụ tọrọ Remi Chukwujieze Ogu n'ụlọ onye odeakwụkwọ Majie bụ Uju Nwanne n'Amaifeke, n'okpuru ọchịchị Ọlụ n'Imo steti, n'ụbọchị Nọvemba 22, afọ 2018.

N'ozi o zipuru, kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Dasuki Galadanchi kọwara na a hụrụ ozu ọkaikpe a n'abalị Nọvemba 23, afọ 2018 n'okporoụzọ gara Amụcha nke dị n'okpuru ọchịchị Njaaba, ebe e kpuchiri ihu ya ma dekwasị ihe odide bụ "SNAP 55" n'aka ya, ebe e jikwa mgbọ egbe were saa ya ahụ.

O kwukwara na ntuziaka o nyere, mere ka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka igbu ọchụ a kpọrọ "Homicide section" banye nnyocha bụ nke mere e ji nwụchie nwaamadị a bụ onye Eziama Ubulu.

Kọmishọna a kọwara na Nnaekezie gbagara na Legọs mgbe ọ kpachara arụ a; bụkwa ebe e jidere ya.

Dịka o siri kwuo, Nnaekezie kwupụtara na ya kpọtara mmadụ atọ ọ kwụrụ puku narị ise (N500,000), bụ ndị nọ n'ọsọ ugbua, ma tinyere onwe ya oge iji gbuo nwoke a o boro ebubo na ya na nwunye ya na-eme enyi.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a