Nnamdi Kanu: Ndị ntoroọbịa Naịjirịa sị ka Naịjirịa kụchaa ya aka - Ndị ntorobịa Ohaneze

Onye na-arịọ mgbaghara Nnamdi Kanu?

Kanu

Okwu ka na-apụtakwa banyere iwu Ọkaikpe Binta Nyako nyere ka aka ndị uweojii kpara onyeisi otu na-achọ ka ekewapụtara ha obodo ha kpọrọ Biafra site na Naịjirịa bụ Indeginous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu.

Ndị onu ha na-ada ugbua bụ otu Bekee kpọrọ Ohaneze Youth, ya bụ ndi ntoroọbịa Ohaneze Ndigbo.

Na ozi Okechukwu Isiguzoro, bụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo Youth Council, na Okwu Nnabuike, bu Odeakwụkwọ ya bụ otu, ha sị na agbajuru ha anya etu eji sị ka anwụchịkọ Mazi Kanu.

Ha sị; "Iwu a nwereike ibute ọgbaghara n'ọwụwa anyanwụ, nke ga-aghasa udo dị na mpaghara ahụ ugbua, ọkachasị etu ozi metụta ogbugbu ụmụ Igbo mere mgbe ejidere Mazi Kanu na mbụ,"

Ha gakwara n'ihu kwuo na onyeghi ihe butere ụdịrị ọbara mgbali elu a gọọmentị Naịjirịa chọrọ ime, ma si na ọ ka mma na-enyere Kanu mgbaghara nke ga-enye aka ka udo chịa.

Nnamdi Kanu si na bụghị onye Naịjirịa

N'akuko dịka ebe ya, Kanu kwuru ebumnuche ya ebe Naịjirịa nọ mgbe ọ na etinye ọnụ n'iwu Ọkaikpe ji okwu ya na gọọmentị Naịjirịa bụ Binta Nyako nyere ka ndị uweojii kpata ya aka.

Ọkaikpe Nyako nyere ya bụ iwu makana ọ si na Kanu gbara ọsọ ụkwụ eru ala iji ghara ịbịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe ya.

Kanu n'onwe ya sị na Nyako na gọọmentị Naịjirịa enweghị ikike ịnwụchịkọ ya makana ya abụghị onye Naịjirịa.

Cheta na Kanu nwere akwụkwọ njirimara nke mba Briten, nke nyere ya ikike bụ nwaafọ Briten nke iwu mba ahụ kpuchiri.

Na mkparịta ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Febụwarị, Kanu kwuru na ya na-abata Naịjirịa "'n'ike na ebube" ị bịa zara ọnụ.

O kwukwara na-ekwesighi ịsị na ya gbara ọsọ ma ya bụrụ na ajụghi ihe na-achụ ya.

Ndị ntọ na ndị uweojii akwaala mgbọ.

Image copyright Getty Images

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti gwara BBC Igbo n'ekwentị ihe ha hụrụ n'ime ọhịa.

Ọ bụ mgbe ha na ndị ntọ kwachara mgbọ ka ha jiri mee nchọpụta a.

"Anyị hụrụ ọbara mmadụ metọrọ uwe dị icheiche nke gosiri anyị na ndị ntọ ahụ merụrụ ahụ"

O kwuru na kama ọkọ akọghị ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị a tọrọ dịka ha na-eme njem na steeti ahụ.

O kwukwara na ọ bụ n'ụgbọala Peace Mass ka ndị ahụ nọ na-eme njem mgbe ihe ọjọọ a metụtara ha.

Anyị aghaghị agba nkịtị!

Image copyright AFP

Minista na-ahụ maka mmekọ mba Saut Afrịka na mba ndị ọzọ na-akpọ nzụkọ gbatagbata ugbua.

Nke a bụ iji chọta ihe a ga-eme nsogbu si na mwakpo, ogbugbu na ọchụchụ ndị mbịarambịara na-agabiga n'ala ahụ.

Ya bụ ọgbaghara bidoro kemgbe izu gara aga mana ọ bụ ugbua ka gọọmentị Saut Afrịka tinyere ọnụ na ya.

N'egwuregwu - Ndị n'ọchị ndị n'akwa.

Image copyright Getty Images

Lee mpụtara asọmpị Premier Lig ndị a gbara taa.

Chi ndị Chelsea mụ anya - Ha jiri ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie otu Cardiff.

Ebe Liverpool jikwa ọkpụ goolu abụọ merie otu Tottenham.

Akukọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Boko Haram have been stepping up attacks with the elections coming up

Na Niger

Ndị omekome Boko Haram meminara mmadụ asaa na ọwụwa anyanwụ mba ahụ na mgbede ụnyaahụ bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Maachị. Ndị ọṅụ ọbara a tọkwara ụmụwannyị abụo ma gbaa ahịa na ụlọ ndị mmadụ ọkụ

Image copyright Getty Images

Mba Nọt Koria na-aba mba

"Nnukwute mwakpo oyi egwu" bụ etu mba Nọt Koria ji kọwa ọbụba abara ụlọ mmekọta ha na mba Spain n'ọwa Febụwarị.

Ha sị na ha che na aka Amerịka dị omume ahụ ha sị megidere iwu ji ụwa dum.

Image copyright facebook.com/NigerianArmy

N'egwuregwu

Otu Onye agha ritere Naịjirịa ọla ọcha na egwuregwu African Wrestling Championship nke emere na Tunisha.

Onye turu ugo a bụ LCpl Hannah Reuben.

Reuben ritere ọla ọcha na mgba nke ndị dị Bekee kpọrọ "72Kg Weight Category".

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri anyị nke taa bụ:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEgwu Chinyere Amaka Ifechukwu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a