South Africa xenophobia: Lee etu eji kwafuo ọbara ndị mbịarambịa n'ime afọ iri

Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Ndị na-achị Saụt Afịrịka na ndị na-anọchite anya mba Afrịrịka ndị ọzọ na-eme nzukọ iji chọpụta usoro a ga-eji gbanyụọ ọkụ na-ada ndị mba ahụ n'obi mere ka ha na-egbu ndị mbịarambịara kwamgbe.

N'ụbọchị Monde bụ ụbọchi mbụ n'ọnwa Eprel, ọ bụ mwakpo a na-awakpo ndị mbịarambịara ka minista na-ahụ maka mmekọ Saụt Afịrịka na mba ofesi bụ Lindiwe Sisulu ga-ebu n'uche mgbe ọga ezute ndị nnọchite anya a.

Nke a na-eme dịka ndị mba ahụ ọsụkọsụ na-asụ chụpụru ndị mbịarambịara, ọkachasị ndị si mba Malawi, n'ebe ha bi ma zuo ha ohi.

Agbanyeghị na ọtụtụ ndị Saụt Afịrịka na-ekwu na ọ bụ iwe n'ihi ihe na-esiri ha ike na-akpata ụdịri omume a, ya bụ ihe a abụghị ihe taa.

"Xenophobia" Saụt Afịrịka

Xenophobia bụ ogbugbu mmadụ makana ọ bụ onye mbịarambịara. Ihe a dị n'ọtụtụ mba, mana ọ bụ Saụt Afịrịka ka ọ bụ akụkọ kwamgbe na nsonso a. Ebe a ka ọkachasị taa akpụ.

Image copyright MARCO LONGARI

Na mba, ndị kachasị buo ibu bụ ndị isi oji. Ndị tara ezigbote ahụhụ n'aka ndị ọcha kpasịrị ha oke agbụrụ site n'ọchịchi nchịgbụ akpọrọ "apartheid" na Bekee.

Ugbua, ọ bụ ndị isi oji bụ ndị obi na-agbawa makana ndị si mpaghara Afịrịka ọzọ nọ na mba ahụ arụ ọrụ ma na-azụ ahịa.

N'ime afọ iri gara aga, ọtụtụ ndị isi oji si Naịjirịa, Zambia, Malawi na ọtụtụ mba ndị ọzọ anwụọla na mwakpo ndị a.

Agbanyeghi na goomenti Saụt Afịrịka na-akatọ mwakpo ndị a, ma na anwụchị ndị aka ha dị na ya, ọ ka na-eme kwamgbe kwamgbe.

N'ọnwa Mee 2008

Ndị ntaakụkọ kọwara ihe mere n'obodo Johannesburg n'ime afọ gara aga dịka "agha".

Ọgbaghara dara ebe ahụ gburu mmadụ 62 ma chụpụ mmadụ 6,000 n'ụlọ ha bi.

Ndị uweojii jidere mmadụ 200 kpara ajọ ike dịka iwakpo nwaanyị n'ike na ohi na ya bụ ọgbaghara.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ puku iri so mee ngaghari iwe maka "xenophobia" n'afọ 2015 na Durban

Nwakpo nke a metụtara ndị Zimbabwe karịa mana ometụtakwara ndị Naijirịa.

Maach 2012

Agbanyeghi na mwakpo abataghi n'oge a, Saụt Afịrịka rịọrọ Naịjirịa mgbaghara etu ha ji chụla ndị Naịjirịa dị 125 n'ihi okwu akwụkwọ "Yellow Fever" ha sị bụ nke adịgboroja.

Naịjirịa sị na ọbụ oke agbụrụ mere Saụt Afịrịka jiri mee ihe a.

Image copyright AFP

Eprel 2015

Ihe ruru mmadụ ise nwụrụ na obodo Durban mgbe ndị Saụt Afịrịka nwakporo ndị mbịarambịa dịka eze ndị Zulu bụ Goodwill Zwelithini sị ka ndị si esi laghachi mba ha.

Agbanyeghi na o mechara sị na ndị mmadụ ghọtaghiere ya, ndị mmadụ ji okwu ya ahụ kpaa ume iji wakpo ndị agbataobi ha.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Puku pụ puku ndị mbịarambịa achụpụrụ n'ụlọ gbara ọsọ ndụ

gst 2018

Ndi uweojii na Soweto sị na mmadu atọ lara mmụọ n'ọgbaghara metụtara ụlọ ahịa ndị mbịarambịa.

Ọtụtụ ndị ihe metụtara bụ ndị si mba Somalia.

Akụkọ sị na okwu bidoro mgbe otu onye Somalia gbagbụrụ otu onye Saụt Afịrịka bịara izu ohi n'ụlọ ahịa ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ha zuru ohi ngwa ahịa ma kwasa ụlọ ahịa onye Ethiopia a

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a