End SARS: "Anyị chọrọ ikpe nkwụmọtọ maka ndụ ndị emefuru"

Ndị na-eme ngagharịwe na Legọs maka okwu SARS

N'ime ihe ha gụnyere bụ nsogbu ha, otu a kpọrọ SIAF pụtara Social Intervention Advocacy Foundation na Bekee kwuru na ha chọrọ mmachi SARS ugbua ugbua.

Ha kwuru na ndị niile echere na otu ahụ gburu agaghị anwụ n'efu dịka ha na-akpọku Gọọmentị Naịjirịa oku ha tinye anya n'okwu a.

Ndị a nwụrụ gụnyere Emeka Ojinze, Linda Igwetu, Richard Gora, Sofiat Yekin, Anita Akpason, Kolade Johnson na Ademola Moshood.

Cheta na ọ bụ ọnwụ Kolade e gburu ebe ọ na-ele eguregwu bọọlụ kpasuru ndị mmadụ iwe eji nwee ọgbakọ a.

Nkenke aha onyonyo Ndị ntorobia na-ewe iwe

Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na atụọla otu n'ime ndị ahụ echere gbagburu Kolade nga ma chụpụ ya n'ọrụ ndịuweojii.

Cheta na Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs bụ Kayode Egbetokun kwuru na aka akparala ndị otu ha aka ha dị n'ọnwụ otu nwoke a kpọrọ Kolade Johnson.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNye anyị ikpemkwụmọto n'okwu Kolade Johnson- Ndị ntorobia

A kpọrọ aha ndị a dịka Ịnsịpektọr Ogunyemi Olalekan na Sajentị Godwill Orji bụ ndị nọ na ngalaba na-ebu agha megide otu nzuzo.

A gbagburu nwaokorobia ahụ na Mangoro, Legọs, ụbọchịụka oge ndị SARS na-achụ nwatanwoke ọzọ ọsọ n'agbataobi ebe Johnson na-ekiri bọọlu.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bala Elkana wepụtara na Twitter, o kwuru na ha ga-elebanye anya n'okwu ahụ n'imeụlọ ma nwe ikpụpụ ha ụlọikpe ma ikpe ma ha.

Otu Amnesty International kpọburu oku ka e nyocha ogbugbu ahụ ndị ha chere na ha bụ ndị SARS gburu Johnson.

N'ozi Amnesty nke onyeisi ha na Naijiria bụ Osai Ojigho,"Kolade Johnson bụ onye onwụ ya kachasị dị ọhụrụ na ndị SARS a marala maka ịkpagbu na igbu n'agbasoghị iwu gbagburu ."

"O kwesiri ka enyocha ogbugbu a ma kpụpụ onye ọrụ uweojii ọbụla aka ya dị na ya ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya."

Nke a na-eme dịka ụmụ Naịjirịa agbakara banyere mkpagbu ndị uweojii a pụrụ iche na-ahụ maka mgbochi ojiegbeezu nke a kpọrọ SARS n'aha ịchafụ na-akpagbu ụmụ Naijiria ma kpọrọ oku ka gọọmenti kposa otu ahụ.

Iwe ha sochiri mgbagbu ndị e chere na ha bụ ndị SARS gbagburu nwaokorobia a kpọrọ Kolade Johnson na Mangoro, Legọs, ụbọchịụka nke 31 Maachị 2019.

Akụkọ kwuru na ndị SARS gara inwụchi otu nwata nwoke so otu onye na-emepụta egwu ama ama maka inwe isi dada n' agbataobi Johnson, ebe ha nọ magbuo ya na ntụmadị.

Ogbugbu e gburu Johnson kpalitere iwe ndị bi n'agbataobi ahụ nke na ha bidoro mewe ngaghariiwe.

Ọtụtụ dịka @amaraedec na-atụ arịrị na a ka na-ekwu maka ahụhụ na ihe isis ike nke gọọmenti wetara, ndị uweojii ndị kwesịrị ichekwa ndịmmadụ bụzị ndị na-egbusiịsị ndị mmadụ.

@Olugbenga kwuru na o kwesịrị ka a hazigharịa ndị uweojii na egbughị oge ọbụla.

Cheta na n'afọ 2018, Ndị mma

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara