NFF Awards: Ahmed Musa ejirila ụkwụ gbata 'goal of the season'

Ahmed Musa Image copyright Getty Images

Ahmed Musa gosiri ụwa ihe e ji ụkwụ eme ka goolu o nyere n'asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2018 nwetara ihe nrite bekee kpọrọ 'goal of the season'.

Cheta na goolu Musa ahụ, bụ nke o nyere ka Naịjirịa zutere mba Iceland, banyekwara na goolu ndị ngalaba FIFA họpụtara maka ndị kacha kpụrụ ọkụ n'ọnụ na ya bụ asọmpi.

Ọnwa Musa tirila na-aga n'ihu ka o ritekwara nwoke kacha agba bọọlụ na Naịjirịa.

Ebe Onome Ebi nke Super Falcons ritere nke ụmụnwaanyị.

Samuel Chukwueze nwetara nzere "onye na-eto eto kachas agba bọọlụ" nke ụmụnwoke.

Anam Imo nke Falconet ritere nturugo dịka ọkaibe n'egwu bọọlụ ndị na-eto eto na mmeme e mere n'abalị Fraide na Legọs.

Imo nwetara nzere 'Young Player of year'.

Onye nchịkọta otu Super Falcons bụ Thomas Dennerby, nwetakwara nzere onye kacha achịkọta otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị.

Ebe otu Super Falcons bụ ndị ọ na-achịkọta nwetara nturuugo dịka otu ụmụnwaanyị kacha agba.

N'aka nke ọzọ, onye nchịkọta otu egwu boolu Rangers Internationa bụ Gbenga Ogunbote ritere nturuugo dịka 'onye ncghịkọta boolu ọpụrụiche (Coach of the year.)

Ndị na-akwado otu Kano Pillars nwetara nzere "ndị nkwado kacha mara ihe egwu na-akụ".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara