Ise Uhie bụ omenala ndị Igbo
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Tattoo: 'Ise uhie ma ọ bụ igbu ichi abụghị ịda iwu'

Ndị ọkachamara n'ihe metụtara omenala Igbo arụtụla aka n'ihe mere ndị Igbo na-eji ese uhie ma ọ bụ igbu ichi n'ahụ ha.

Nke a na-abịa dịka ndị uweojii na Legọs kwuchara na ha ga-amalite ịnwụchi ndị ntoroọbịa bu isi dada nakwa ndị sere uhie ma ọ bụ gburu ichi n'ahụ ha.

Agbanyeghi na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii a bụ Bala Elkana agọrọla aka ya maka nke a, ọtụtụ ndị mmadụ karịsịa ndị maara omenala nke ọma katọrọ okwu ya.

Ọ bụ okwu a mere BBC Igbo ji kpọtụrụ ndị ọkachamara abụọ n'omenala Igbo bụ Ọzọ Nonso Mcginger Ibeneme na Ezenka Udochukwu Maurice ka ha tinye ọnụ n'okwu a.

Nkenke aha onyonyo Naanị ndị dị ike ga-egbụ ichi

N'azịza nke ya Ọzọ Mcginger kwuru na ịka ihe n'ahụ bụ ihe malitere gboo n'ala Igbo, iji gosipụta ọtụtụ ihe dị icheiche.

O kwuru na nke a gụnyere; ịka ihe n'ahụ maka ọgbanje, ndị bara na mmọnwụ, igbu ichi maka ndị chiri echichi, ịte uhie maka ịchọ mma ụmụnwaanyị.

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ nwụrụ maka ịgbuichi a

N'otu aka ahụ Ezenka Udochukwu kwuru na e nwere ụzọ ihe anọ mere ndị Igbo ji egbu ichi.

Nke a gụnyere; Igbu ichi nke agbụrụ iji mata ebe mmadụ si, igbu ichi nke eji agwọ mmadụ ọrịa, igbu ichi maka echichi, igbu ichi maka ịkanye mmadụ ọgwụ n'ahụ.

Mana ha kwuru dịka ugbua na omenala Igbo na-agbanwe nke mere ndị mmadụ anaghi eji zi ike ese uhie ma ọ bụ egwu ichi n'ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara