Man City vs Brighton: Jesus agbatala ọsọ enyemaka

Gabriel Jesus Image copyright AFP

Ufọdụ ndị chebu na Man City ga agbakasị Brighton ahụ mgbe ha zutere ụnyụaahụ mana ụmụ Pep Guardiola ahụghị bọọlụ gbaa.

Man City bidoro ọfụma ka isi Gabriel Jesus kụbara bọọlụ Kevin de Bruyne nyere ya n'ime goolu Brighton ka a ka nọ n'ime nkeji anọ.

Ka nke ahụ mechara, Brighton jidere bọọlụ kpọchie mana ha ya bụ usoro ha wetere enyeghịrị ha aka maka ha ahụghị ohere inye goolu nke ha.

Onye na-echere Man City bọọlu bụ Kyle Walker buru isi ya budo n'ihu Alireza Jahanbakhsh nke Brighton nke mere anya onye nchịkọta asọmpị ji chaa manụ manụ, mana enyeghi ya akwụkwọ ọbara ọbara.

Mmeri a enyela Man City ohere ịga agba nke ngwụcha nke Iko FA ebe ha ga-ezute Watford maọbụ Wolves n'ubọchị nke 18 nke ọnwa Mee.

Nke mekwere ya Iko atọ Man City ka na-achụzi ike n'ọkpọ a.

Cheta na ha ritere Carabao Cup, ka nọdụkwa na Premier League nakwa Champions League.

Onye isi ya pụtara n'asọmpị a

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aymeric Laporte tara akpụ n'asụ na ya bụ asọmpị. Onwere mgbapụ omere n'ọnụ goolu bụ ejecha agbwụ. Ya bụru na-omeghi nke ahụ, agaghị na-ekwu na Man City agafeela.

Mana anyi agaghi echefụkwa isi Jesus!

Man City ga-ezute Tottenham na Premier League taa.

Brighton na Bournemouth ha ezute ụbọchị Satọdee na-abịa n'asọmpi Premier League.

Isiokwu Ndị Emetụtara