Christian Chukwu: Femi Otedola agbatala ọsọ enyemaka

Image copyright @realFemiOtedola
Nkenke aha onyonyo Chukwu bụbụ onye nchịkọta otu Super Eagles

Egwu ọma ejula ọnụ ndị be Christian Chukwu na-arịa ọrịa dịka akajiakụ bụ Femi Otedola kwetere ikwụ ụgwọ ụlọọgwụ ya.

Ụgwọ ahụ ruru puku dọla iri ise.

Ụlọọrụ mgbasa ozi "Cable" depụtara na Otedola mere nke a iji kwado onye o chere fere ala nna ya n'ụzọ dịmma.

Otu akpọrọ Nigeria Football Federation ekwela nkwa ịnyere Chukwu aka.

Christian Chukwu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Christian Chukwu so na ndị mbụ butere iko mba ụwa Afrika

Chukwu onye dị afọ iri isii na asatọ chịrị otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa bụ Super Eagles mgbe ha mabutere iko mba Afịrịka mbụ n'afọ 1980.

Cheta na gọọmenti Enugwu steeti gọrọ ụkwụ na aka na o nweghị mgbe ha gbahapụrụ Christian Chukwu bụ onye dara nnukwu ọrịa ugbua.

Udedi Joseph bụ Kọmishọna egwuruegwu na-ekwu na gọmentị Enugwu akwụọla ụgwọ ihe niile na onye ọbụla na-arịọ ego n'isi ya bụ onye nrụrụaka.

Ọkụ gbara n'ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị nOwere

Ọkụ agbara n'ọdọụgbọelu Owerri Image copyright @IamOAR

Ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị na Owere gbara ọkụ n'ehihie Monde.

Ihe ọma dị ya bụ na emenyụọla ya bụ ọkụ ebe ebugharịrị nfeda ụgbọelụ.

Ụlọikpe Ukwu akwọpụla aka n'isi Magnus Abe

Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara ịgbagha onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti.

Nke a mere dịka otu akụkụ APC na Rivas họpụtara Tonye Cole, ebe nke ọzọ họpụtara Abe dịka onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019.

Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monde na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ.

Tanzania ga-eso mechie 'water proof'

Mizengo K Pinda Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Prime Minister mba Tanzanian bụ Mizengo K Pinda

Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara megide onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti.

Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monday na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ.

N'egwuruegwu,

Anyị na-echebiri asọmpi Chelsea na West Ham n'abalịa,

Ire na izu ahụ mmadụ

Anụ ahụ mmadụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Emechiela ire na ịzụ anụ ahụ mmmadụ na mba ụfọdụ

Otu kpọrọ onwe ha International Organisation for Migration ekwuola na ọnweghị mgbe ha ji kwuo na iri na izu ahụ mmadụ juru eju na mba Middle East.

Onye kwuru nke bụ ọnye ọnụ na-eru n'okwu na otu ahụ bụ Ikechukwu Attah.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị agha Naijiria si na lekwara nwaanyị ha kuturu n'Aba

NỤgbọala Ndị agha Naijiria Image copyright PIUS UTOMI EKPEI

Ndị agha Naijiria Akụkọ kwuru na ụgbọala Hilux nke ndị agha Naijiria kuturu nwaanyị na-agara onwe ya ka ọ chọrọ ịgbafe okporoụzọ ụbọchị Fraide.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọdachie ahụ akaghị ime ma ọ bụụ ụgbọala ahụ agbaghị n'okporo o kwesghị ịgba ma jirikwa oke ọsọ mee nke a.

Mana isiụlọọrụ ndị agha Naijiria kwuru n'akụkọ na ha eletaghị nwaanyị ha merụrụ ahụ abụghị eziokwu.

Na nkọwa ha, ha kwuru na ha bugara ya ụlọọgwụ ma kwụkwara ya ụgwọ ụlọọgwụ.

Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ ndị biara na-eleta ya n'ụlọgwụ.

Ndị ntọ atọrọla onyeisi ndị ọrụ imenyụ ọkụ na Legọs

Image copyright facebook.com/Lagos-State-Fire-Service
Nkenke aha onyonyo Rasaki Musibau nọ n'etiti

Onyeisi ndị uweojii bụ Bala Elkana ekwuola na ndị ntọrị nwụchịkọrọ Rashidi Musibau na mmadụ isii ọzọ na mpaghara Ikorodu n'abalị Satọde akpọbeghi ezinụlọ ndị ha tọọro.

Rashidi Musibau bụ otu n'ime ndị isi ndị ọrụ gbatagbata na Legọsi.

Elkana kwuru na ndị ntọrị tọrọ ya na mmadụ isii ndị ọzọ ya na ha so n'ime obodo Ikosi-Ejirin, ọ sị na ndị ntọrị si ebe mmiri nọ wee gbochie ha n'ụzọ, tọrọ ha gbaba n'ime ụgbọ mmiri ha.

Ụgbọelu bepụrụ isi onye agha

Image copyright Getty Images

Ihe nya mmiri mere mgbe mberede kwanyere otu onye agha si agha lọta na mma ụgbọelu nke bere isi ya tọgbọ.

Eniela nwa amadị a so ebuso Boko Haram agha n'usoro ndị alakuba.

Ndị ogbunigwe nwụrụ eruola mmadu ise

Image copyright Getty Images

Ndị ọrụ gbata gbata na Maịduguri na-akọwa na ndị nara mụọ site na ogbunigwe ndị omekome abụọ gbara ụnyaahu eruola mmadụ ise ka ndị ihe a metụtara n'eru mmadụ iri anọ na ise.

Ihe a mere mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe ha bu n'ahụ na obodo Muna Dalti.

N'ofesi

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Kirstjen Nielsen bidoro ọrụ n'afọ 2017

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa obodo na mba Amerịka bụ Kirstjen Nielsen esorola n'ime ndị Onyeisiala Donald Trump tinyere n'ọrụ tinyere akwukwọ arụkwaghịm.

N'egwuregwu

Nwaafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo so na ndị denyere aha ya n'akwụkwọ mgbe Shanghai Shenhua ji ọkpụ goolu ise asatara otu sị Beijing Renhe ntọọị n'asọmpị Chinese Super League asụru ụbọchịụka

Lee ihe nkiri anyị tata

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a