Notre Dame Cathedral: Ọkụ agbaala nnukwu ụlọụka Notre Dame

Akụkọ chara akwụ taa:

Ọkụ agbala ụlọụka Notre Dame Cathedral

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionThe fire department said a major operation was under way

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọkụ amabeghị ihe butere ya enwurula n'ụlọụka Notre Dame Catheral dị na Paris, mba France.

Ndị ọrụ gọọmenti na-ekwu na o nwere ike ọ bụrụna ọrụ e ji n'aka ugbua n'ụlọụka ahụ kpatara ọkụ ahụ .

N'afọ gara aga, ụka Katọlik kporo oku ego iji were ruzie ụlọụka ahụ nke na-adakpọ adakpọ.

Otu ọnụ na-ekwuru ụlọụka ahụ bụ nke Katọlik kwuru na ihe niile na-agba ọkụ, o nweghị ihe ga-afọ."

Dịka ozi si n'ụlọrụ onyeisiala mba Francce pụta siri kwuo, onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron agbahapụla ebe o kwesịrị ịga gawa ebe ihe mere.

A na-arụzigharị Notre Dame Cathedral nke nde kwuru nde ndị njem nleta na-aga ahụ kwa afọ kemgbe a chọpụtara na o nwere akụkụ ya gbawara agbawa.

Ihe ị maghị maka Notre Dame Cathedral

  • Ọ nweghị ebe nkiri na France dịka Notre Dame ma ewepụ Eiffel Tower.
  • Notre Dame adịrịlarị kemgbe agbata afọ 1200 dịka ọ gbara afọ karịrị narị asatọ
  • Notre Dame anọọla na enweghị ihe mere ya n'Agha mba ụwa abụọ alụrụla

Ozubulu massacre:Ụlọikpe atọhapụla mmadụ abụọ so na ndị anwụchiri

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017

Ka anyị malite n'Anambara ebe ụlọikpe ukwu dị n'Awka tọhapụrụ mmadụ abụọ eboro ebubo na aka ha dị na ọchụ ahụ e gburu na St. Phillip Catholic Church Ozubulu.

Okaikpe ukwu bụ Jọstis Fidelis Aniukwu kwuru na ya ahụghị ihe gosiri na aka Chinedu Akpunonu na Onyebuchi Mbanefo dị na ya ọchụ e gburu na ụbọchị isii nke ọnwa August afọ 2017.

Ịmachị ndị ọgbatumtum

Image copyright Chioma Obianinwa
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti Anambra steeti nyere iwu ịmechi ọgbatumtum (okada) n'okporoụzọ Ọka na nke Ọnisha site n'ụbọchị mbụ onwa Julaị 2018

Onyeisi ndị uweojii n'Enugu adọọla ndị ọgbatumtum aka na ntị maka ịda iwu etiri gbasara ịgba ọgbatumtum.

Ọzọ dịka ibe ya, cheta na mmachị ọgbatumtum ịgba ga-dị n'Enugwu steeti.

Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Sulaiman Balarabe enyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie ndị na ada iwu ahụ ma kpachie ọgbatumtum ha ma kpụpụ ha ụlọikpe.

Idemmiri na Ghana

Image copyright Getty Images

N'ofesi e, okeide mmiri sitere na oke mmiri zoro ụbọchị ụka na mba Ghana egbuola mmadụ ise ka ya bụ mmiri zochara naanị awa atọ.

Seji Saji bụ osote onye isiọrụ National Disaster Management Organisation gwara BBC nke a mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ole Gunnar Solskjaer Onye nkuzi Manchester United

N'egwuruegwu, Manchester United akpọpụtala aha dike na dimkpa iri abụọ na abụọ bụ ndị ga-eso sọọ mpi Champions League ha na Barcelona ụbọchị Tuzde na-abịa.

Cheta na Barcelona ji otu ọkpụ nyụọ Manchester anya mgbe ha gbara nke agba nke mbụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Woods turu ugo Masters na Augusta National

Image copyright Reuters

Nke mere ya iko mbụ na-abata ya aka kemgbe afọ 2008.

Onweghị tinye maọbu mwepụ ego n'abịa na mmanụ agbịdị

Image copyright Getty Images

Gọọmentị Naịjirịa sị gị dere juu makana ha ekpebibeghị ịwepụ atụmatụ Bekee kpọrọ fuel subsidy.

Gọọmentị sị na onweghị ihe ọbụla na-eme ga-akpata ka ewepụ ya ugbua.

Gwomgworo bu mmanụ agbịdị agbawala ka ogbunigwe na Gombe

Image copyright @Followlastma
Nkenke aha onyonyo Moto na-agba ọkụ

Mmadụ iri na abụọ nwụrụ ebe mmadụ iri na isii merụrụ ezigbote ahụ n'ihe mberede a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe bụ Mary Mallum sị na ọ bụ wa wa wa butere ihe mberede okporo ụzọ a.

Ndị agha Sudan na-anwụchịkọ ndị otu Omar al-Bashir

Image copyright Reuters

Ndi agha napụrụ Omar al-Bashir ọkwa na mba Sudan amalitela ịnwụchịkọ ndị ya na ya so chịa mba ahụ.

Ndị agha Sundan mere nke a ka ha ka na-ekwekwa nkwa na ha agaghị achụpụ ndi na-eme ngaghari iwe na mba ahụ.

Gee nkeji a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Isiokwu Ndị Emetụtara