Fuel subsidy: Ọ kara anyị mma na e wepụrụ ya - Chizea

Igwe e ji ere mmanụ
Nkenke aha onyonyo Igwe e ji ere mmanụ

Ọkammụta n'ịhe gbasara akụnaụba bụ Boniface Chizea kọwara na-uru dị n'iwepụ ego mgbakwụnye a na-akwụ na mmanụ ụgbọala nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na Bekee karịrị ọghọm dị na ya.

Cheta na onyeisi International Monetary Fund bụ Christine Lagarde kpọrọ gọọmenti etiti oku ka ha wepụ ego ha na-agbakwụnye iji hụ na mmanụ ụgbọala ndị ọnụ ala.

Ngwa ngwa o kwuru nke a, ụkọ mmanụ ụgbọala malitere n'ụfọdụ obodo ndị mepere emepe dịka ndị mmadụ malitere ịzụ mmanụ ụgbọala aghara aghara n'ihi egwu ụkọ ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIwepụ 'fuel subsidy'Ọ ga-ebute ihe ịda oke ọnụ - Chizea

Mana na mkparịaụka ya na BBC Igbo nwere, Chizea kọwara na mbido na iwepụ 'fuel subsidy ga-ebute ihe ịda oke ọnụahịa mana ahapụ ya n'ihe ga-adịkwa mma dịka gọọmentị enwe ike ịchekwa ego a kara imefu n'ikwụ ụgwọ 'subsidy. tinye ya n'ọrụ.

"Ndị mmadụ anaghị aghọtacha: Ọ ga-ebute ihe ịda oke ọnụ obere."

"Ndị ji ya enwe ego karịrịị akarị: ndị ọnọ-na-etiti, ndị na-ezupu mmanụ anyị na mba ọzọ bụ ndị 'subsidy dabanyere."

Chizea onye bụbu onye ọrụ ụlọakụ kwuru na ọ bụ oge gọọmenti nọ ugbua weliiri ego a na-ere mmanụ kwesịrị ka ha wepụ aka n'itinye ego ole a na-ere mmanụ.

Na nkọwa ya, ọghọm dị na ya gụnyere:

  • Fuel subsidy mere na ego e kwesịrị inye ndị na-arụpụta ngwaahịa iji tubata akọrọngwa ha ji arụ ọrụ a na-enye ya ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala.
  • Gọọmenti na-ebi ego were na-akwụ ụgwọ subsidy, o kwuru na ọ bụụ na enweghị ihe e mere maka nke a, Naijiria ga-alọghachi n'ọnọdụ ọ nọ tupu Ngozi Okonjo-Iwela nweta mgbaghara ụgwọ e bitere.

Akụkọ ga-amasị gị: