Endsars: 'Mụgharịanụ etu esi e bu egbe'

Onyeisi ndí uweojii Mohammed Adamu. Lagos 15-04-19.

Isiokwu kachasị mkpa na njem onyeisi ndi uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu na Legọs bụ iwu o nyere ka ndị uweojii niile mụgharịa usoro ha ji ebu egbe.

O kwuru nke a ka ọ na-ezi ndị uweojii ozi na ụlọakwụkwọ ndị uweojii nke dị n'Ikeja na Legọs.

O zute kwara ndị nọchitere anya ezinaụlọ Jessy Gold bụ nwata nwaanyị nwụrụ n'aka ndị uweojii na Legọs.

O ji ohere ahụ zie ha ozi itiakanobi gbasara ọnwụ nwa agbọghọ ahụ ebe ma kwuo na ozuola bụ na ozuola.

Adamu kwukwara na ngalaba ndị uweojii agaghị anabata mmehie ọbụla n'aka ndị uweojii nọ n'okpuru ha.

Otu ọkaiwu bụ Obuesi Phillips nọchitere anya ezinaụlọ nwaada nwụrụ kelere onyeisi ndị uweojii maka okwu ya.

Ọ rịọrọ ya biko hụ na-emezuru iwu ya n'abụghị okwu a ga-ekpofu ma ọ tụgharịa azụ.

Tupu ọ laghachi Abuja, ọ gakwara nleta nkwanye ugwu n'ụlọọrụ Gọvanọ Legọs bụ Akinwumni Ambode.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a