Juventus vs Ajax: C Ronaldo abụrụla 'Erọn gba aka'

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ mbụ n'ime afọ itoolu Ronaldo agaghị eru agba ọkara-ikpeazụ n'asọmpi Champions League

Ajax a na-ele anya ka 'obere mmadụ' ebe Juventus nọ agbaalara ha ụgbọ nwamkpi.

Ọkpụ goolu Donny van de Beek ji gbakaa neetị na nkeji 34 na nke Matthijs de Ligt ji isi takpuo na nkeji 67 zuru ịkpọ Juventus ntu n'obi.

Na Cristiano Ronaldo maburula iko a ugboro ise bu ụzọ nye goolu na nkeji 28, akwụsịghị ihe mgbu ndị Juventus maọlị.

A sị na Juventus gbalịrị inye goolu abụọ, egwu a gaara abụ kpọkịrịkpọ makana ha gaara enweta oghere iji zọọ isi onwe ha, mara ma ha a ga-agafe banye agba ọkara-ikpeazụ.

Ajax ga-ezute onye meriri n'etiti Manchester City na Tottenham.

Cheta na Tottenham ji otu ọkpụ goolu emeri Man City.

Omotola Jalade na Bashir Ahmad na-akwata ya:

Image copyright Omotola Twitter
Nkenke aha onyonyo Omotola .j. Ekeinde

Nwaada ji ihe onyonyo eri bụ Omotola Jalade-Ekeinde dere n'akara twitter ya ụnyahụ sị na Naịjirịa bụ ọkụmmụọ.

Na nzahachị ya onye nnyemaka pụrụiche na mgbasa ozi Onyeisiala Mohammadu Buhari zahachiri ya na okwesighi ikwu otu ahụ maka na ndị ji ọrụ anaghị ekwu okwu.

Lee ka nkata ya sị ga:

Maka ndị omeiwu n'Owerri

Ụlọomeiwu n'Imo steeti akpọchitela ndị otu ha achụpụrụ achụpụ maka ịda iwu ụlọomeiwu ụlọopmeiwu n'Ọktoba 2018.

Onye ndu ndị ụlọemeiwu ahụ bụ Acho Ihim nabatara mmadụ ise ndị ahụ n'ọgbakọ ha nwere tata bụ Tuzde ụbọchị iri na isii n'Apreel, 2019.

Ndị gunyere na ndị a nabatara bụ Chiji Collins (si n'Isiala Mbano), Uche Oguwuike (nke Ikeduru), Ifeanyi Nnataraonye (Mbaitoli), Donatus Onuigwe (Oru West), na kenna Nzeruo (nke Oru West).

Ụgbooloko gburu mmad na Kano

Owerri Image copyright Getty Images

Akụkọ na-erụ anyị na-ekwu na ụgbọoloko akwọpịala mmadụ abụọ ha amabeghi ndị ha bụ na Kano.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Abdullahi Harunana Kano steeti gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ abụọ ndịa dinara n'okporo ụzọ ụgbọ nke dị n'azụ Kano Club, dịka ha nwetere ya bụ ozi n'ụtụtụ taa bụ Tuzde.

Ọkụ Notre Dam

Notre Dame Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Notre Dame na mba France

N'ofesi, ọtụtụ mmadụ ọkụ gbara ụlọ ụka Notre Dame wutekarịrị ekwela nkwa nde kwuru nde Euro maka iruzi ụlọụka ndị Fada bụ Notre-Dame na France.

Amatabeghi ihe bidoro ya bụ ọkụ gbara ụlọụka ruru afọ narị asatọ na iri ise (850 year).

Man. U na Barcelona

Camp Nou
Nkenke aha onyonyo Camp Nou na Spain

N'egwuruegwu, ndị nkwado Barcelona na Manchester United ekeela nkwucha maka ịnabata ndị otu ha na Champions league n'abalị a.

Ha ga-akwarịta mpi na Camp Nou n'elekere asatọ nke abalị tata.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Wike enwetala asambodo ya

Nyesom Wike na onye órú Inec ebe ó na-anata asambodo mpútara ya Image copyright @Nyesom Wike/Facebook

Ọ bụ taa ka ngalaba na-elekọta ntụliaka na Naịjirịa nyere Nyesom Wike asambodo mmeri ya.

Nyesome Wike zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru otu PDP meriri na Rivas steeti n'agbanyeghị ọgụ na mgba na ọgbaghara dapụtara.

E megharịrị ntuliaka ahụ meburu n'ụbọchị 9 nke ọnwa maachị mgbe a hụrụ na mpụ na nrụrụaka na-arị ibe ya elu.

Ọ bụkwa na ntuliaka ahụ ka Inec na ndị ọzọ boro ndịagha Naịjirịa ebubo na ha gbochri ntuliaka ị gaa ọfụma na Rivas steeti.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Tomato na-adị arị elu n'oge udu mmiri.

Anambara anwụchiela ndị na-ana ụtụ isi aghụghụ n'ahịa

Kọmịsọna na-ahụ maka azụmahịa Christain Madubuko kọwara na gọọmentị Anambra nwụchiri mmadu atọ na steeti ahụ.

O kwuru na ndị a, nke otu n'ime ha a bụ eze, ji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego ụtụ isi n'ahịa.

Madubuko dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ha hie asaa na anya gbasara onye ha na-akwụ ụtụ isi ma kwukwa na ọ bụ sọsọ gọọmentị nwere ikike ihibe ahịa.

Image copyright Getty Images

Islamic Steeti si na emela mwakpo ọzọ na Naịjirịa,

Otu oyi egwu eji Islamic State mara ekwuola na ha gburu ndị agha iri abụọ na atọ na Naịjirịa ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Epreelụ.

IS si na ọ bụ ogbunigwe ebu n'ụgbọala ka ha jiri kpa ike a n'obodo Tumbum dị na Borno.

Ndị agha Naịjirịa etinyebeghi ọnụ na ya bụ okwu.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Lieutenant General Omar Zain al-Abdin onyeisi ọchịchị ndị agha na Sudan

Na mba ofesi,

Ọgbakọ mba Afrịka bụ African Union sị na ha chọrọ ka ndị nkịtị were ọchịchị na mba Sudan.

Otu AU si ndị agha ji ọchịchi na mba ahụ mee ngwa ngwa kagbuo atụmatụ ha iwezuga iwu ji obodo ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Watford ebee

N'Egwuregwu,

Goolu Aubameyang nyere bụ ihe eji gụọ ọjị mgbe Arsenal zutere Watford ụnyaahụ.

Watford dị mmadụ iri gbacha asọmpị ahụ ka onye ndu ha bụ Troy Deeney natara akwụkwọ ọbara ọbara