Nigerian police bill: Ụlọomeiwu ukwu ebinyela aka n'akwụkwọ iwu
Akụkọ kachasị
Ụlọomeiwu etinyela aka n'akwụkwọ
Ebe foto si, @NGRSenate
Ụlọomeiwu ukwu Naịjrịa ebinyela aka n'ịkwado iwu ga-enye ohere ịwelite ọnọdụ ndị uweojii na Naịjirịa akpọrọ Police Reform Bill 2019 na Bekee.
Nke a mere ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ha.
Akwụkwọ iwu a akpọrọ Senate Bill 683 nwetere nkwado ndị omeiwu ka ọ gafechara ọgụgụ nke atọ.
Onye gụpụtara ya bụ Sinatọ Tijjanj Kaura (APC-Zamfara North) were nwete nkwado Mao Ohuabunwa (PDP-Abia North).
Onyeisi ha bụ Bukola Saraki kwuru na nke a bụ mbụ a na-akpatụ iwu a aka kamgbe afọ 1943 ma kele kwa ndị kọmitti na-ahụ maka ndị uweojii dpụtara iwu a.
Alan Garcia agbagbuola onwe ya
Ebe foto si, AFP
Alan Garcia bụbu Onyeisiala Peru
Onye bụbu onyeisiala mba Peru bụ Alan Garcia agbagbuola onwe ya oge ndị uweojii bịara ịnwụchị ya.
A sị na Garcia bụ onye nwụrụ n'ụlọọgwụ riri ngarị sita n'aka ọtụ ụlọọrụ si mba Brazil, bụ nke ọ gọọrọla isi ya ọtụtụ oge.
Ọ nwụrụ n'ụlọogwụ dị n'isi Obodo ha bụ Lima dịka onye na-achị ugbua abụ Martín Vizcarra kwuru.
Ụlọọrụ EFCC na Malabu
Ebe foto si, EFCC
Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaipke D.Z Senchi nọ n'isi ya enyela ụlọọrụ EFCC ikike ịnwụchị ndị a sị na aka ha dị na nrụrụaka na ngarị gbasara mmanụ agbidi Malabu.
Ndị a gụnyere Minista na-ahụbu maka mmanụ agbidi n'oge mbụ bụ Dan Etete, Mohammed Adoke bụbu Minista ikpe nkwụmọtọ na ọkaikpe ukwu Naịjirịa.
Ndị ọzọ ewepụtara aha ha dịka ndị buru awoo a na-achọachọ bụ Raph Wetzels, Casula Roberto, Pujato Stefeno, nakwa Burrato Sebastiano.
Ndị kwesiri iwuchi n'ihu ụlọikpe a taa ụbọchị iri na asaa ọnwa Epreelu mana ha a bịaghị nke mere ọkaikpe Senchi ji nye ihu ka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nwụchie ha ebe ọbụla ahụrụ ha.
Ndị uweojii na ka esị eso ha
Ebe foto si, Yomi Shogunle/Twitter
Yomi Shogunle bin talk say #EndSARS no be serious mata
Abayomi Shogunle agwaala ndị mmadụ ha hapụ ị sụ sụprị-sụprị ma ndị uweojii kwụsị ha iji gbalahu mmegbu.
Ọ bụ n'akara Twitter ya ka o si zipu ozi a na-ekwu na asụsụ Bekee ekebiri bụ "Pidgin" ka mma.
Ndị mmadụ amalitela iji ya eme akaje maka ya bụ okwu.
"Onye azọpụtara"
Ebe foto si, ViralPress
Ọ bụ aha ọhụrụ ndị ọrụ mmanụ agbidi na mba Thailand bara nwa nkịta ha si n'ime osimiri zọpụta.
Ndị ọrụ ahụ sị na ha hụrụ ya ebe ọ na-agba mgba ndụ ya tupu ha zọpụta ya gụgharịa ya aha.
Ndị uweojii na ndị ha nwụchịrị
Ndị uweojii na Delta steeti sị na ha akparala mmadụ ise ha na-ebo ebubo na ha wakporo ụlọ ọrụ ha n'Asaba.
ASP Chukes Oresewezie bụ onye binyere aka n'akwukwọ mgbasaozi sị na ndị a ha ji, ha nwetere mma na egbe n'aka ha bụ ndi Ipob.
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị na ibepụ onye ọchị ehi isi n'Ebonyi steeti nọzị n'aka ndị uweojii.
N'uche ndị uweojii, ọ bụ mmegwara mwakpo ndị ọchị ehi wakporo obodo Onunwakpu n'afọ gara aga butere nke a.
N'egwuregwu,
Dịka Naịjirịa na-akwado Asọmpị mba Afịrịka, Emmanuel Amunike ekwuola na ya bu njem agaghị adị mfe.
Ebe foto si, @FAA/@oluwashina (Twitter)
Amunike sị na otu egwuregwu ụfọdụ mba aha ha adịghị ada ụda ọfụma n'egwuregwu bọọlụ ga-ejikere iwunyere mba dịka Naịjirịa aja na garri.