Onye ọbụla nara ụtụisi n'ahịa a ga-akpụpụ ya ụlọikpe - Adinuba

Ahia dị n'ala Igbo

Ebe foto si, @randomphotojournal

Kọmishona mgbasa ozi dị n'aka n'Anambra steeti bụ Gideon Chukwuemeka Adinuba ekwusiele ike na onye ọbụla nara ndị ahịa ụtụisi n'ahịa ọbụla na steeti ahụ ga-aga mkpọrọ.

Adinauba sị na "ndị dị otu a na-etinye ndị mmadụ n'oke ahụhụ nke gọọmenti achọghị ma ọlị".

Ọ kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC ebe ọ sị na "onweghị onye nwere ikike ịna ụtụisi na-abụghị gọọmenti".

Atụọla ihe karịrị mmadụ 75 mkpọrọ maka ịtịnye aka na ụdị ọrụ a.

Ebe foto si, AFP

Ụnyahụ Kọmịshọna okwu ahịa dị n'aka gosiri ọha ndị ha kpọpụụrụ ndị ụweojii bụ ndị ha sị na-ana ụtụisi n'ahịa Ekwulobia dị n'Okpuruọchịchị Agụata.

N'aka ọzọ, Kọmishona mgbasa ozi sị na "oteela aka arịọwara ndị na-akpa ụdị agwa a ha sepụ aka ya bụ enwe n'ofe", mana ha nyụrụ ntị mmanụ.

Uzochukwu Ozumba bụ onye okaikpe kwukwara na n'ezie "ọnwekwara ahịa ụfọdụ ndị obodo rụrụ, ọ ga-adị njọ isi ndị obodo ahụ anatala ụtụisi na ya bụ ahịa".

Ebe foto si, Getty Images

Mana Ozumba kwetere na gọọmenti nwere ikike ịkwụsị onye ọbụla gara ịnata ụtụisi n'ahịa ọ rụghị.

Ọ sịkwa na gọọmenti nwekwara ikike itinye anya n'ahịa ndị obodo rụrụ mana "okwesighị ekwesi gọọmentị ịkwusị ndị obodo ha anatala ụtụ n'ahịa ha rụrụ".

Okwusiri ike na gọọmentị kwesiri ị kpọpụta ndị gana anakọtara ha ụtụ n'ahịa ha.

Akụkọ ga-amasị gị