Education system: Ihe mere ndị ntoroọbịa ji agbahapụ agụmaakwụkwọ na Naịjirịa
Ministrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa kwuru na ihe ruru mmadụ nde iri isii agụghị akwụkwọ na Naịjirịa karịsịa ndị ntoroọbịa na ndị okenye.
Nke a mere anyị ji na-ajụ kedụ ihe kpatara o jiri dị etu a?
N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ onye nkuzi na Mahadum Ebonyi Steeti bụ Nkechi Emma-Echiegu, ọ rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe na kpata nke a.
Nke gụnyere;
- Oke mmefu ego ndị ọchịchị na-emefu
O kwuru na ọtụtụ ndị ntoroọbịa bịa tụle ụdị ego ndị nọ n’ọchịchị na-ebute nke ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ nkeọma anaghị enwete na-eme ka ha gbahapụ agụmaakwụkwọ ma chọwa ego mbute.
- Enweghi ndị nkwado n’ụlọakwụkwọ
Nkechi kwuru na ụfọdụ oge ọtụtụ ụmụakwụkwọ maara ihe ekwe na-akụ enweghi ndị na-akwado ha n’ịkwụ ụgwọ akwụkwọ, ịzụ akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ.
Nke a na-eme ka ha gbahapụ agụmaakwụkwọ ma chọwa ihe ọzọ.
- Oke ọchịchọ dị n’etiti ndị ntoroọbịa
Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-achọzi ụzọ ha ga-eji bute ego ọsọsọ ma hapụ ịgụ akwụkwọ.
Ha na-ahụta ị ga n'ụlọakwụkwọ ihe ruru afọ anọ, ise ma ọ bụ karịa dịka igbu oge.
O kwuru na ọtụtụ ha na-etinya aka na mpụ na ịgwọ ọgwụ ego dị iche iche nke gụnyere igbu mmadụ maka na ha hụrụ ka ụfọdụ ndị okenye mere ya ma ọ dabara ha.
- Azụghị ụmụnwaanyị n’akwụkwọ
O kwuru na ọtụtụ omenala na nkwenye ụfọdụ ndị mmadụ bụ na ụmụnwaanyị ekwesighi ịgụ akwụkwọ na ọ bụ naanị ụmụnwoke.
Nke mere na ogogo agụmaakwụkwọ n’etiti ụmụagbọghọbịa ji adị ala.
Gịnị bụ ụzọ mgbapụta?
Nkechi Emma-Echiegu kwuru na iji hụ na ogogo agụmaakwụkwọ n’etiti ndị ntoroọbịa gbagoro elu na Naịjirịa bụ ọrụ dịrị ndị gọọmentị, nne na nna nakwa ndị ntoroọbịa.
Gọọmentị kwesiri inye ezigbo nkwado na ọzụzụ dị icheiche, belata ọnụ ego ụlọakwụkwọ ma nyekwa ohere agụmaakwụkwọ n’efu.
Nne na nne ga-agba mbọ nye ụmụaka ezigbo ọzụzụ na ohere ka ha mụọ ma ọ bụ gụọ ihe masịrị ha karịa ịmagide ha ịgụ ngalaba akwụkwọ ọbụla.
Ndị ntoroọbịa iwedata isi n’ala gụọ akwụkwọ ma hapụ ịchọ ego mbụte.