Sri Lanka bombings: Unu emerela ndị aka dị na mwakpo a ebere - Buhari

Muhammadu Buhari Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari agbarụọla ihu na mwakpo eji ogbunigwe mee n'ụlọụka atọ nakwa ụlọ ndịna anọ dị na mba Sri Lanka taa bụ ụbọchi ụka Easter.

O kwuru nke a site n'ozi onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasa ozi bụ Garba Shehu nke o wepụtara n'ụbọchị ụka n'Abuja.

Buhari kasiri ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ ma kpe ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbaakee ọsọ ọsọ.

Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị ọrụ nchekwa ghara ịzọ ndị ọbụla aka ha dị na mwakpo a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDeadly explosions strike across in Sri Lanka

Ihe ruru mmadụ nari abụọ na asaa na asaa anwụọla ka ihe karịrị mmadụ narị anọ merụrụ ahụ n'ime mwakpo eji ogbunigwe mee n'ụlọ ụka nakwa ụlọọriri na mba Sri Lanka.

Ụda ogbunigwe anụrụ ruru isi. Ụlọ uka atọ ka edoro na mwakpo a. Ha bụ Kochchikade, Katuwapitiya na Batticaloa.

Mwakpo a metụtakwara ụlọ oriri na ezumike atọ di na Colombo bụ Shangri La, Cinnamon Grand na Kingsbury.

Mwakpo bịara ka ndị ofufe kraịst na-eme emume Easter Sunday sọ n'oriri kachasị dị omini n'ofufe ha.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo St Anthony's Shrine dị na Kochchikade so n'ebe edoro na mwakpo a

Foto pụtara na Soshal midia gosiri ime otu n'ime ụloụka ndị ogbunigwe gbawara n'ime ya - St Sebastian dị na Katuwapitiya - ebe elu ulọ ahu yasachara ebe ọbara nọ n'ọche.

Ndị ntaakụkọ Sri Lanka na-akọwa na ndi ofesi bịara nleta nwereike nọrọ n'ime ndị ihe metụtara.

Onwebeghi onye si na aka ya di na mwakpo ndị a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a