Third Mainland Bridge: Onweghi ihe mere akwammiri a - Fashola

Onye mịnịsta na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ebe obibi bụ Babatunde Fashola ekwuola na onweghi ihe mere Akwammiri Third Mainland.

Akwa Third Mainland
Nkọwa foto,

Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ebe obibi bụ Babatunde Fashola ekwuola na onweghi ihe mere Akwammiri 3rd Mainland. Ọ gwara ndị ọgwọ ụgbọala ka ha gaa n'ihu na-eme njem n'elu akwammiri a na ọ gaghị ada. O kwukwara na gọọmentị enyochala akwammiri ahụ bụ nke ha ga-amlite ọrụ n'oge n'adịghị anya. Cheta ọtụtụ ndị bi na Legọs chị obi ha n'aka ka ihe onyonyo a na-eke na soshal midia na-atụ aka na akwammiri nke ukwu dị na Legọs bụ nke Bekee kpọrọ Third Mainland Bridge chọrọ ịda.

Nkọwa foto,

Third Mainland Bridge a bụ akwammiri nke kachasị too ogo n'ọdịda anyanwụ nke Afịrịka, ma bụkwara ọkachamkpa n'ihe banyere njem na Legọs.

Nkọwa foto,

Akụkọ na-ewu na soshal midia na-akọwa na ndị ọrụ nọ n'akwammiri a ugbua, mana ọ bụ naani onye na-azacha ihe ka BBC Igbo hụrụ.

Nkọwa foto,

Eziokwu bụ na-arụchara ọrụ na ya bụ ụzọ, mana ọ bụ ite kọrọta ka emere. Dịka ụdị a dị n'aka ekpe.

Nkọwa foto,

Ebe a ka ihe onyonyo ahụ na-egosi.

Nkọwa foto,

Dịka anyị siri hụ, ya bụ ebe riri mperi

Nkọwa foto,

Ebe a ekwesịghị ighe ọnụ chakoo etu a.

Nkọwa foto,

Ọ dị njọ n'anya.

Nkọwa foto,

Ọkachasị ma ịlete etu okwesiri ịdị dịka etu ebe a dị.

Nkọwa foto,

Mana ndị ọkachamara sị obi daa anyi juu, na akwa arụrụ ọfụma kwesiri ị na-enwe nkebi, ma na emegharị ahụ. Ya mere ejiri etinye ya nkebi, dịka nke a dị n'Akwa Third Mainland Bridge

Nkọwa foto,

Nkebi akwa na-enye ya ohere ikuru nwa ụme, adịghi ama ama, makana akwa arụrụ ọfụma kwesiri ị na-agba egwu obele obele.

Nkọwa foto,

Ọ bụ nkebi akwa a na-anọ n'etiti ohere a enyere ka o ji na-ekute ụme.

Nkọwa foto,

Ya bụ na obi ekwesịghị ịmapụ gị ma akwammiri ị no n'elu ya na-emegharị nwa ahụ, mana nke ebe ahụ nwere mperi na Akwa Third Mainland kwesiri ka ndị ọdị n'aka tinye anya na ya ka ọ dị ka ụmụnne ya.

Nkọwa foto,

Ọkachasị etu Legọs siri bụrụ obodo akwammiri ka nkụ n'ime ya.

Nkọwa foto,

Ihe ọzọ ndị ọkachamara kwuru bụ: Akwammiri na-efegharị akụkụ abụọ ma ikuku kuo, na amalikwa elu ma mmadụ na ụgbọala na-agafe. Akwamiri kwesiri ịna efe n'akụkụ, nakwa elu na ala. Nke a ga-eme ka ọghara ịgbaji. Onwere ohere a na-ahapụ n'akwammiri ịnyere ya aka ịnwete ohere maka otụtụ igwe ejiri rụọ ya. Ọ bụru na ohere ndị a adịghị ya, oke ifufe kuo maọbụ anwụ chasie ike, igwe ejiri rụọ ya koo afọ, akwammiri ahụ ga-agbaji ma dakasịa. Ohere na adị n'akwammiri ukwu na-enwe eze igwe. Nke na-anọ n'akwammiri nta bụ rọba ka eji eme ya nke bụ na ọ na-akwa mkpumkpu n'ịsi ya abụọ. Ya bụ mgbe ọzọ ị na agbafe akwammiri, cheta na mmegheghị ahụ ndị a ọ na-emegherị bụ ka esi rụọ ya.

Nkọwa foto,

BBC kpọrọ Maazị Hakeem Bello bụ ọnụ na-ekwuru Babatunde Fashola bụ Minista na-ahụ maka ọrụ na ụlọ na Naịjirịa. Maazị Bello si ka obi daa ndi mmadụ juu, na onweghi ihe mmapụ obi na-eme. Ọ sị "akwa dị etu okwesiri ịdị. Anyi emeela nyocha wee chopụta na onweghi ebe ojiri chọ isi daa."