Easter Monday: Lee mmọnwụ ndị pụtara ịgba 'Easter' na Coal Camp
Ka ndị ofufe Kraịst na-eme mmemme 'Easter', ndị Coal Camp Enugwu tiri mmọnwụ dị icheiche iji mee ka obodo kpotu ọkụ.

Mmemme ncheta mbilite n'ọnwụ kraist mere n'ụdị ọpụrụiche n'Coal Camp Enugwu ebe ụdị mmanwụ karịrị nari abụọ gbara n'ọgbọ.
Mmemme a kporo ezigbote ọkụ na Coal Camp. Ndi mmadụ di ka aja, ma ndị si ụlọ, ma ndị si ofesi.
Malite n'Owa Streeti rue na Tailor Avenue ndị mmanwụ si Nkanụ, Ngwo, Udi, Nsukka nakwa ebe dị icheiche kwụrụ na ahịrị na egosiputa ụkwụ egwu ha nakwa omenala dị icheiche.
Ụbọchi ahụ abụghị ụbọchị Ọkụ mgbịrịngba na Ịgarịga na-acho okwu. Ọ bụ ụbọchi nwoke, nwaanyị, nwata na ogbondu na-apụta ikiri mmonwu.
Mana, asikwa Ịgarịga nye gị ọsọ, mee ka ụkwụ gị ruo azụ isi gị, okachasi ma ịbụrụ ogbondu.
Ọkụ mgbịrịngba so na mmonwu pụtara n'ọgbọ.
Ọfọdụ ụmụ afọ Coal Camp sị ebe dị iche iche lọta kwuru na ebe ọ sọrọ ha nọrọ na ha nwere obi ụtọ na amụrụ ha na Camp. Aha mmọnwụ a bụ Ajọ ihe.
Mmọnwụ ukwu dị ka Okwo mma pụtara n'ọgbo.
Mmadu dị ka aja na Coal Camp
Ọtụtụ mmadu si na ha na-enwe anụrị maka etu esi hazie mmemme a na Coal Camp.