Ooni of Ife: Ndigbo na Yoroba bụ ụmụ otu afọ mụrụ

Adeyeye Enitan Ogunwusi
Nkenke aha onyonyo Adeyeye Enitan Ogunwusi bụ otu n'ime ndị kacha okorobịa na ndị Eze obodo

Onye ọkammụta n'ihe gbasara ihe ọkpụ na mahadum University of Nigeria Nsukka' bụ Chidi Ugwu ekwuola n'eziokwu dị n'ihe Ọọni nke Ife kwuru sị ihe jịkọrọ Igbo na Yoroba.

Ọọnị nke Ife bụ Oba Ogunwusi Adeyeye arụtụrụ aka na Igbo na Yoroba bụ otu afọ mụrụ ha.

Adeyeye, onye tụpụrụ okwu oge onyeisi Ohaneze na Legọs bụ Solomon Ogbonna gara leta ya n'obi ya n'ọgwụgwụ izuụka, " Legọs so n'ala Yoroba. Anyị niile bụ otu. Akụkọ mgbe ochie gbara akaebe.Kedụ ihe mere anyị ji alụso onwe anyị ọgụ."

"E nwere ogo ndị Igbo dị iche iche si Ife gawa ebe ndị ọzọ ga mepee alaeze. Otu n'ime ha nupụrụ isi ma lọghachi n'Ife bịa bute ọgbaghara ebe ha sibu pụta, ebe a na-akpọ Olugbo."

Nnukwu eze ahụ nwere agba n'ala Yoroba, kwuru na ụfọdụ ndị Yoroba amaghị banyere akụkọ ihe mere oge gboo katọrọ ya oge ya kwuru otu okwu ahụ na nsonso a.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Oba Adeyeye Ogunwusi bụ eze kachasị nwe ọkwa n'ala Yoroba

"Anyị kwesiri ịkwu eziokwu ka eziokwu gbapụta anyị. Anyị bụ otu afọ. Bikonụ mesapụnụ ahụ n'alal Yoroba ma kwanyere ụmụnne ụnụ ndị Yoroba ugwu."

Ọ gara n'ihu kwuo, "Ana m arịọ gị gaa gwa Ndigbo niile na ha esighị n'agburu ndị Ju, ọ bụ ndị Ju si na agburu ụnụ."

"Ka anyị dozie ma na-emekọta ihe ọnụ."

Ogbonna gwara BBC Igbo n'okwu sị n'ọnụ Ọọni "ọ bụghị akụkọ ifo."

"O gosiri na Ndigbo bụ ndị a chọrọ achọ n'ụwa niile."

Eziokwu Igbo na Yoruba nwere ige gosiri na ha metụtara-kammụta

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChidi Ugwu: Asụsụ Igbo na Yoroba na-asụ na-egosi na o nwere ka ha siri bụrụ otu

Na nkọwa ya, ọkammụta n'ihe gbasara ihe ọkpụ na Mahadum University of Nigeria Nsukka' bụ Chidi Ugwu kwuru n'ezie na o nwere ihe jịkọrọ Igbo na Yoroba.

"Asụsụ ha na-asụ na-egosi na o nwere ka anyị na ha siri bụrụ otu. Ihe m ma bụ na Ndigbo na Yoroba so na 'Kwa' Group."

"Ihe ọmụma atụ bụ etu anyị sị nwe 'afa, "Ifa bụ afa' n'Igbo

'Atọ' ndị Yoroba na-akpọ ya 'eta'

"I lee anya n'akụkụ Yoroba ị ga-ahụ ka "Igbo" siri bata n'aha obodo ụfọdụ dị na Yoroba."

"Chi na-efo, ndị mmadụ na-agbasa, asụsụ ha ana-adịwanye iche."

Kedụ ihe butere ekworo dị n'etiti Yoroba na Igbo?

Image copyright Chief Sunday Jude Iyoke
Nkenke aha onyonyo Kedụ ihe bu ekworo dị n'etiti Ndigbo na Yoroba?

Ugwu kwuru n'ọ bụkarịrị ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị na-etinye nkewa.

Ihe ọzọ ọ tụrụ aka bụ na Yoroba na Ndigbo kachasị waa anya na Naijiria nke mere na ekworo ọtọrọ-onye-na-onye bụ ihe na-akpata ndọrọndọrọ n'etiti agburu abụọ a.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara