Sri Lanka attacks: Ụmụ atọ otu nne na nna ji nwụrụ na ọdachi

Sri Lankan military officers stand guard outside church after attack Image copyright Getty Images

Ụmụ atọ n'ime ụmu anọ ide ego Anders Holch Povlsen nwere nwụrụ na mwakpo e ji ogbunigwe mee na Sri Lanka, dika otu n'ime ọnu na-ekwuru ya gwara BBC.

Ezinaụlọ a nọ njem nleta na mba ahụ maka mmemme Easter.

E kwubeghị aha ụmụaka.

Maazị Holch Povlsen nwee ụlọọrụ na-ere akwa ama ama aha ya bụ 'Bestseller.'

Ọ bụ ya kachasị nwee oke n'ụlọọrụ na-emepụta akwa a kpọrọ Asos, ma bụrụkwa onye nkịtị kachasị nwee ala na mba Briten, dịka ụlo ntaakụkọ Times siri kwuo.

Otu onye na-ekwuru Bestseller gwara BBC n'email, na "Ọ bu eziokwu na ihe a mere."

"Anyi na-arịọ ka unu kwanyere ezinaulọ a ugwu ka ha na-eru ụjụ, o nweghị ihe ọzọ anyi ga-ekwu."

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Maazị Holch Povlsen

Amabeghi ọtụtụ ndị nwụrụ

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na Sri Lanka eruola 290.

Ndị uweojii ejidela mmadụ 24, mana o nwebeghị ndị sị na ọ bụ ha mere ihe a.

Ndị kachasị n'ime ndi nwụrụ bụ ndị Sri Lanka, nke ọtụtụ n'ime ha nwụrụ n' ụka Easter.

Ndị ọrụ gọọmentị sị na ha na-eche na ndị sị mba 36 so n'ime ndị nwụrụ na mwakpo a.

A mabeghị ndị ọtụtụ n'ime ndị a bụ.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Nne na nna ụmụaka nwụrụ

Ndị a si mba ofesi gunyere:

  • Ihe karịrị mmadu mba Briten asatọ - gunyere abuọ nwere akwụkwọ mba Amerịka
  • Ndị Demark atọ
  • Ndị India isii
  • Ndi Turkey abụọ
  • Otu onye Portuguese
  • Ndị China abụọ
  • Ndị Australia abụọ
  • Otu onye Holland
  • Otu onye Japan

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a