Rochas Okorocha: Anyị ga-eso ihe ụlọikpe kwuru maka asambodo Okorocha - Inec

Rochas Okorocha

Akụkọ a kpụ n'ọnụ ugbua bụ na Ọkaikpe Okon Abang nke ụlọikpe ukwu nke Abụja eserele aka ya n'ihe metụtara ikpe dị n'etiti Inec na aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha.

Ihe a na-eme na-erughi izuụka ole na ole Ọkaikpe Taiwo Taiwo sepụrụ aka na ya bụ ikpe.

Okorocha kpụpụrụ Inec ụlọikpe ka ọ mara ma nke ahụ ọ ga-eme ka ha nye ya asambodo e ji ama onye tozuru ịnọchite anya mpaghara Ọlụ zoonu n'ụlọomeiwu ukwu n'Abụja.

Cheta na Inec gbara isi akwara sị na ha agaghị enye Okorocha asambodo maka ebubo na ndị na-akwado ya manyere onye rụru ọrụ ka ihe Bekee kpọrọ "Returning Officer" nke ntuliaka e mere na mpaghara Ọlụ n'ọnwa Febụwarị ka a kpọpụta aha ya dịka onye meriri.

Mgbe ahụ, Ọkammụta Francis Ibeawuchi gwara BBC Igbo na e tiri ya ihe ma megide ikike dịrị ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFrancis Ibeawuchi sị na ndị na-akwado Okorocha manyere ya ịsị na o meriri

N'agbanyeghi na Okorocha gọrọla aka na ụkwu ya n'ihe mere Ibeawuchi, Inec sị na ya bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkakwụ, nke mere ka ha foro ntutu taa n'isi Okorocha na ha agaghị enye ya ohere ịnata asambodo a nke a kpọrọ "Certificate of Return".

Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Abang esorola ụkwụ Taiwo; amabeghi ma a ga-ekpechakwa ya bụ ikpe tupu o ruo ubọchị nke iri abụo na itoolu nke Mee, bụ oge a ga-edu ndị omeiwu na-abata ọhụrụ n'iyi ọrụ.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye, ịjụ ya etu eke ha si anya anwụ.

Okoye sị na okwu ahụ bụ n'aka ndị ụlọikpe ka ọ dịzị.

Ọ sị; "Ihe Inec kpebiri bụ na anyị ga-eme ihe ọbụla ulọikpe sị ka anyị mee.

"Ha sị anyị nye ya asambodo, anyị ga-enye ya asambodo, ha sị ka anyị gaa megharịa ntuliaka ahụ, anyị ga-eme etu ahụ.

Ha sịkwanụ na ọ bụ ịga n'ọgbọ vootu dị iche iche gaa chịkọta ọnụọgụgụ vootu, ihe ahụ ka anyị ga-eme."

Akụkọ ga-amasị gị: