Child malaria vaccine: A ga-enyocha ọgwụ mgbochi ịba na Malawi

Ebe foto si, D Poland/PATH
Anwaala ọgwụ mgbochi mbụ ma na ọ bu n'obere obere
Nnukwu nyocha ọgwu mgbochi mbụ maka ọrịa ịba amalitela na Malawi.
Ọgwụ mgbochi a akpọrọ 'RTS,S vaccine' na-akụziri ihe na-alụrụ ahụ mmadụ ọgụ etu ha ga-esi awakpo ịba, bụ ihe anwụnta na-ebunye mmadu ma ọ taa ya.
Na mbụ, obere ịgba ọgwụ mgbochi a gosiri na ihe ruru pasentị 40 n'ime ụmụaka dị ọnwa 5 ruo 17 nwetere ọgwụ a nwere mgbochi.
Ọrịa ịba dịka ọ na-arị ọzọ na ka o mechara afọ iri enwetere mmeri n'iluso ya ọgụ.
Dịka ọnụọgụgụ kwa afọ si ụwa niile na-akọwa na ọrịa a na-arigo arigo kama ịda ada, nke butere egwu na o jikwa ike alaghachite.
435,000 died of malaria worldwide
219m infectedAfrica saw more than 90% of cases and deaths
Malawi bụ mbụ n'ime mba atọ a họpụtara iso na mgbochi mbụ a e ji ewepụta ọgwụ a. Ọ ga-enye ụmụaka puku narị iri abụọ dị afọ abụọ gbadawa mgbochi.
Mba ndị ọzọ bụ Ghana na Kenya ga-amalite nke ya n'izu ụka na-abịa.
Kedụ etu nsogbu ọrịa ịba dị?
Ọrịa ịba na-egbu ihe ka mmadụ 435,000 n'ụwa niile kwa afọ, ọkachasị ụmụaka.
Ndị ọrịa a na-egbu karịrị n'Afịrịka, ebe ihe karịrị ụmụaka 250,000 na-anwụ kwa afọ, dịka WHO si kwuo.
E bidoro ịnwa ọgwụ a n'afọ 2009.
"E nwere mba asaa so nwaa ihe a ụmụaka 15,000 so mee," Dọkịnta David Schellenberg gwara BBC Newsday.
Ọ sị; "Nwale a gosiri na ọgwụ mgbochi a na-egbochi ịba. Onweghị ihe ọjọọ ọbụla ọ na-eme."
A họtara mba ndị a makana ha na-eme nnukwu mgbochi ịba, nke gunyere iji 'net', ma nwekwa ọtụtu ndị bu ọrịa ịba.
Ebe foto si, Getty Images
Oteela ndị mmadụ na-eti mkpu ka ewepụta ọgwụ ga-agwọ ịba
Akụkọ ga-amasị gị: