Nwoke agbaala nwaanyị na ezinaụlọ ya ọkụ maka ịjụ ya enyi

Akụkọ sepụtara isi n'ụtụtụ a

Ụlọ ọkụ gbara

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke ejirila ọkụ gbagbuo mmadu Asatọ n'otu ezinaụlọ maka na ada ha nwaanyị gbajọrọ ya. Ihe mere n'Okitipupa dị n'Ondo steeti.

Nwoke a aha ya bụ Deji Adenuga nọ n'ọsọ ụkwụ erughi ala ugbua.

Ndị Sịnetị agbatịala oge itinye aka na Bọdjetị rue izuụka ọzọ

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook

Ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Sịneti agbatịala oge itinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2019 rue tuzde ịzuụka ọzọ bụ ụbọchị iri atọ ọnwa Epurelu.

Onyeisi ha bụ Bukola Saraki kwuru na akwụkwọ gosiri n'uju echiche mkpata na mmefu a erutebeghi ha aka ma nye iwu ka eme ka o ruo ha aka n'izuụka ọzọ.

Nke a kwesiri ịbụ ugboro atọ ha ga-eleba anya n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2019 a.

N'aka nke ọzọ, ndị ụlọnnọchite anya n'ụlọomeiwu kwụsịrị nzukọ ha na-eme taa mgbe ndị otu Shiite bu ngagharịiwe bata n'ime gburugburu ụlọomeiwu.

Idemmiri egbuola ndị mmadụ na Saụt Afrịka

Ebe foto si, Reuters

Ihe karịrị mmadụ iri isii anwụọla na mba Saụt Afịrịka mgbe nnukwuu mmiri ozizo butere ide mmiri n'obodo Durban.

Mmiri a bidoro zowe n'izu Easter tochiri ụlọ akwụkwọ na ulo ndị mmadụ. A ka na-acho ọtụtu mmadụ.

N'egwuregwu

Ugo ga-ebere na mgbagbu taa mana amabeghi ma ọ bụ nke Manchester City ka ọ bụ nke Manchester United.

Otu abụọ ndị a ga-ezute na Old Trafford taa n'asọmpi Premier League.

Ọ bụ ịkparị Igbo ma bụru na enyeghi ọwụwa-anyanwụ oke n'ọchịchi ndị omeiwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ

Ndị kwuru nke a bụ ndị ntoroọbịa ọhaneze ka ha na-adụ pati na-achị Naịjirịa bụ APC ọdụ maka nhọpụta ndị ga-achị ụlọomeiwu nke itoolu.

Dọkinta Kingsley Dozie bụ osote onyeisi ndị ntoroọbịa Ohaneze bu onye kwuru nke a n'Owere.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-awụchi Legọs taa

Buhari na-abịa ịgbape ụzọ ọhụrụ, ụgbọala BRT nakwa ụlọ ifo gọọmentị aka na-achi Legọs bụ Akinwumi Ambode hibere agbanyeghị na-arụchabeghị ụfọdụ n'ime ha.

Ebe foto si, AFP

N'ofesi,

Aka na-achị mba Nọt Korea bụ Kim Jong-Un nọ na njem ịga hụ onyeisiala Rusia bụ Vladimir Putin na obodo Vladivostok.

Maazị Kim ji ụgbọoloko nke ya aga nzukọ a ga-abụ nke mbụ ya na Putin ga-enwe.

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu,

Ọnu dị ndị otu egwuregwu Barcelona sọsọ ọchị ka ha ji ọkpụ abuo asataghi ihe ọbụla sị Alaves 'mechie ọnụ' mgbe ha zutere ụnyaahụ.

Mmeri a nyere Barcelona ohere ịkwụsi ike n'ịzọ iko La Liga.