Chris Ngige: A tụgharịrị ihe m kwuru maka ndị dọkịta

Chris Ngige Image copyright @LabourMinNG
Nkenke aha onyonyo Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige agọọla ụkwụ n'aka ya na ihe a sị na ya kwuru maka ndị dọkịta abụghị etu ya siri kwuo ya.

N'ozi nke onye nnyemaka n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Nwachukwu Obidiwe wepụtara, ngige kwuru ka ihe ya kwuru bụ na ndị dọkịta anaghị enwe ohere ọzụzụ na Naijiria nke mere ha ji aga alabekee maka ịgụwanye akwụkwọ iji bụrụ ọkaibe n'ọrụ ha.

Ọ gara n'ihu kwuo nke bụ ihe ọma nyere Naijiria dịka ha na-ezilata ego na ihe ha mụtara n'ala bekee.

"E wezuga okwu na Naijiria emezughị ntuziaka WHO na e kwesiri iwe dọkita nye mmadụ nari isii ọbụla, ihe ọbụla m kwuru bụ eziokwu gba ọtọ nke onye ọbula kiri mkparitaụka ahụ n'uju ga-ekwenye na ya."

"Agbanyeghị na gọọmenti etiti agbaliala n'ebe ahụike, Naijiria erubeghị ebe ọ kwesịị ịnọ. Ugbua anyị enweghị ụlọọgwụ zuru ịnabata ndị dọkita chọrọ ọzụzụ pụrụ iche(residency) dịka naanị pasent 20 na enweta ohere."

"Nke a pụtara na nwere ikike ịga alabekee maka ọzụzụ,bụrụ ọkaibe, na-arụ ọrụ ma na-ezilata ego ụlọ."

Cheta na mkparịtauka ya na ndị ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere na Wenezde, Ngige sị na obi anaghị amapụ ya maka akụkọ na ndị dọkịnta na-apụ aga mba ofesi n'ihi na ndị dọkinta enwere na Naịjirịa zuru ezu.

Ngige sị, "Ọnaghị amapụ m obi. I nwee ọtụtụ, izipu. Ha na-apụ, mụta ọrụ nke ọma, ma na-ezitekwa ego n'ụlọ."

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị dọkịnta bekee bụ "Nigeria Medical Association" bụ Francis Adedayo Faduyile tinyere ọnụ n'ihe mịnịsta na-ahụ maka ọrụ kwuru maka ọnọdụ ndị dọkịta na Naịjirịa.

Dọkịnta Faduyile sị na okwu a Ngige kwuru gosiri na ọ maghị etu ihe kwụụ ugbua.

Ọ sị, "Ọ bu eziokwu na Ngige bụ Dọkịnta, mana nke a apụtaghị na ọ ma ihe na-eme ugbua. Kedụ mgbe ọ rụrụ ọrụ dịka dọkinta? Ọrụ eji mara ya ugbua bụ Mịnịsta. Anyị nwereike kwuo na uche ya adịghịzị n'ihe a na-eme banyere ọgwụgwọ ahụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na Ngige ma etu o si kwụrụ ugbua, ọ ga-ama na ihe kwesiri ị bụ omenala bụ na mmadụ 600 kwesiri ike otu dọkịnta, "Ihe anyi nwere na Naịjirịa bụ mmadụ 6000 n'otu dọkinta."

Faduyile sị; "Ọ dị ka ihe Ngige na-arụtụ aka bụ ohere gọọmentị steetị na nke etiti wepụtara iji wee ndị dọkịnta n'ọrụ. Ohere a epeka."

Ọ sị na enwereike agaghị ata Ngige ụta maka ọmaghị maka ihe akpọrọ "Abuja Declaration" ebe aka na-achi mba dị iche iche n'Afịrịka kwekọrịtara na pacent 15 nke bọọjetị ga-abụ maka ahụike.

"Naịjirịa enyetubeghi pacenti isii mbụ. Ihe anyị na-eru bụ ise. Afọ gara aga bụ pacent atọ na ọkara. Afọ 2019 bụ pacent atọ na ọma asatọ."

Faduyile sị na ahụike ndị Naịjirịa dị ha mkpa, mana ọtụtụ ndị nọ na gọọmentị na-eme ka ọmasịghị ha makana ha nwere ohere ifepu ga mba ofesi ga nata ọgwụgwọ.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa nọ na soshal midia tunyere ọnụ na nke a.

Onye nwe akara @monye_morris juru etu Ngige jiri bụrụ onye eji eme akaja:

Onye ji akara @AOJ_Jesse sị na Ngige kwuru okwu ka onye na-ere ahịa n'Alaba.

Akụkọ ga-amasị gị: