Ọgụ 'ndị otu nzuzo' ataala isi mmadụ atọ n'Umudioka n'ime ọnwa ole ma ole

Ifeanyi na Mmesoma nwunye ya

Ndị obodo Akpom dị n'ukpuru ọchịchị Dunukofia dị n'Anambra Steeti ekwuola na ogbugbu egburu otu nwata nwoke n'oge olili di na nwunye agbara ọkụ bụ ikpe dị n'aka ndị uweojii.

Ifeanyi Ikechukwu na Mmesoma nwunye ya ka ndị echere na ha bụ ndị otu nzuzo gbara ọkụ n'afọ gara aga.

Mana Mgbe a na-eli di na nwunye ahụ n'ubọ Fraịde nke bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelu, ọgbaghara dapụtara bụ nke tara isi otu nwaokoroọbia onye Umudioka.

Otu onye ọkanmụta bụ Harry Obi Nwosu, bụ onye Umudioka, gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na-egburu otu nwaokoroọbịa Umudioka n'oge olil Ifeanyichukwu Ikechukwu na nwunye ya.

Maazi Nwosu kwuru na ha adọọla ụmụokoroọbịa obodo ha aka na ntị ka ha ghara ịkpa ọgbaghara ga-ebute ọnwụ mmadụ ọzọ.

Otu nwoke na-ere ihe n'Akpom Umudioka kwuru na ọ bụ ihe nwute etu ụmụokorọbịa na-ala ndụ ha n'ịyị.

Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọ onyeisi obodo ahụ bụ Ọkaiwu Ikebudu, enweteghị ya, ebe ndị nọ n'ụlọ ya ekweghi enye akara ekwe ntị ya.

Ọtụtụ ụmụokoroọbịa Umudioka a gbara ajụjụ ọnụ n'ahịa Afor Igwe Umudioka kwuru na ọ bụ ọgụ ndị otu nzuzo bidoro ịkwafu ọbara ahụ.

Emeka onye achọghị ịpụta n'onoyonyo boro ebubo na Emmanuel bụ onye akpọrọ ya na nwunye ya ọkụ nọ n'otu nzuzo "Senior Vikings".

O kwuru na "ọ bụ n'ihi esemokwu dị n'etiti ha na ndị otu "Ayes" mere eji gbaa ya na nwunye ya ọkụ n'ụlọ ha n'afọ gara aga".

Ọ bụ izuụka gara aga dịka a na-eme olili ya na nwunye ka agbagburu onye ọzọ".

Nwa okoroọbịa ọzọ bụkwa onye Umudioka akpọrọ Ugochukwu kwuru na egwu jizi onye ọbụla n'ihi na onweghi onye ma onye ọzọ ha ga-egbu.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na ndị uweojii enweteghi akụkọ na-agbara Ifeanyi na nwunye ya ọkụ mgbe ihe a mere n'afọ gara aga.

Ọ si Kama na ọ bụ mgbe egbuchara nwokoroọbịa n'olili ka nyocha ha chọpụtara na ọ bụ ndị mmadụ gbara Ifeanyi na nwunye ya ọkụ.

O kwuru na ọ bụ otu n'ime ndị a na-eche na ha bụ ndi otu nzuzo bịara ibute ọgbaghara n'olili Ifeanyi na nwunye ji egbe gbagbuo onye otu ha na-amaghi ama.

Haruna kwuru na ndị uweojii anwụchiela onye ahụ gburu mmadụ dịka nyocha ka na-aga n'ihu ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị: