World Malaria Day: Kedụ ihe bụ ịba na etu anyị ga-esi kwụsị ya?

Ebe foto si, Getty Images
Malaria is spread by infected mosquitoes
Kedụ ka anyị ga-esi kwụsị ọrịa ịba?
Ọrịa nke nwere ọgwụgwọ ka na na-egbu mmadụ rinne: Ọ na-egbu otu nwata nkeji abụọ ọbụla,ebe e nwere nsogbu ya nde 200 kwa afọ, dịka WHO siri kwuo.
N'afọ 10 gara aga, ọgụ megide ọrịa ịba mịtara mkpụrụ, mana kemgbe afọ 2015, ndịiche dị n'ọganihu ahụ apụtachaghị ife : Ozi nchọpụta WHO wepụtara n'afọ 2018 na-egosi na onweghị ndịiche doro anya na na mbelata ndị ọrịa mere na afọ 2015 nakwa 2017.
Ebe foto si, Getty Images
Oke ahụ ọkụ, onye ọmụma na isiọwụwa so n'ihe e ji ama onye na-arịa ịba
Dịka abalị Eprelụ 25 bụ ụbọchị ncheta ọrịa ịba n'a mbaụwa, lee ihe ndị ọ dị mkpa ka ị mata:
- Ịba bụ ọrịa na-egbu mmadụ nke ụdị nje Plasmodium anọ na-ebute. Ha bụ: P. falciparum, P. malariae, P. ovale nakwa P. vivax.
- A na-ebufe nje ndị ma anwụnta 'anopheles' nwaanyị bụ ya taa mmadụ
- A na-agwọ ịba ma na-egbochikwa ya egbochi
- N'afọ 2017, e nwere nsogbu ịba dị nde 219 na mba 87 dịka WHO siri kwuo
- Mmadụ 435,000 nwụrụ n'ihi ọrịa ịba n'afọ 2017.
- Afrịka bụ ebe ịba kachasị akpa ike- Pasent 92 ọrịa ịba e nwere mere n'Afrika, ebe pasenti 93 ndị nwụrụ n'ọrịa a bụ n'Afrika
- Ego niile atụnyerela ị ha gbasara mgbochi na ịchụ ịba eruola ihe dịka ijeri dọla $3.1 n'afọ 2017
Njirimara ọrịa ịba
Njirimara ịba - Oke ahụ ọkụ, isiọwụwa na oyi ọmụma - nke na-abịa ihe dịka abali 10 rue 15 anwụnta bụ ịba tara mmadụ.
Nke a nwere ike jiri nwayọọ nke na agaghị ama na ọbụ ya , mana ọ bụrụ na eleghị ya anya awa iri abụọ na anọ, ịba nke Plasmodium falciparum na-ebute nwere ike ịkawanye njọ ghọọ nnukwụ ọrịa nwere ike dunye n'ọnwụ.
Onye nwere ike ịrịa ya?
Ebe foto si, Getty Images
Ụmụaka amụụ ebe ịba na-akpaịke nwere ike ibute ọria ahụ
N'afọ 2017, ọkara mmadụ nọ n'ụwa nọ n'egwu ibute ọrịa ịba
Ụmụaka erubeghị afọ ise bụ ndị kachasị nwe ike ibute ya. N'afọ 2017, ha dị pasent 61 nd(mmadụ 2666,000 ndị ịba gburu n'ụwa niile.
Ndị ọzọ ịba na-awa agba bụ ụmụnwaanyị dị ime na ndị ahụ ha esichaghị ike.
Kedụ mpaghara ịba ka akpa mkpamkpa?
Ebe foto si, Getty Images
Ịba kachasị akpa ike n'Afrịka
Dịka WHO siri kwuo, ndị rịaala ịba nakwa ndị o gburula kacha na mpaghara Afrịka, mana ụfọdụ akụkụ ọwụwa anyanwụ Asia, Eastern Mediterranean, Western Pacific, n'Ọdịda Amerika sokwa na-ebe ọ na-emetụta.
N'afọ 2017, mba ise ketara ọkara mmadụ ole rịara ịba n'ụwa niile: Naijiria (25%), DRC Congo (11%), Mozambique (5%), India (4%) na Uganda (4%).
Ibusa ọrịa
Ebe foto si, Getty Images
Anwụnta na-ebu ụdị nje Plasmodium anọ na-ebute; P. falciparum, P. malariae, P. ovale nakwa P. vivax
ọtụtụ mgbe, ọ bụ anwụnta 'anopheles' nwaanyị na-ebufe nje ịba ma ọ ta mmadụ.
E nwere ụdị anwụ 'anọpheles 400 nke 30 n'ime ha na-ebu nje ịba.
Anwụnta ndị a na-ata n'mgbede rue n'ụzọ ụtụtụ.
Anwụnta 'anopheles' na-eyi akwa n'akụkụ mmiri, nke na-aghọ ọbụbụ , o mecha ọghọ anwụnta; ọ bụ nwunye anwụnta na-achọ ọbara o jielekwa akwa ya.
Mgbochi
Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2017, ọkara ndị n'iile nọ n'egwu ibute ọrịa ịba bụ ndị enyere nchekwa akwa e ji echeta (nchọpụta WHO)
WHO na-enye ndụmọdụ ka e chekwa ndị nwere ike ịnweta ọrịa ịba site n'ụsoro dị ire.
Ụzọ nchekwa abụọ bụ - neetị e jiri ọgwụ anwụ were siji na ịgba ọnwụ anwụ(IRS).
Ịrahụ n'okpuru neeti e ji ọgwụanwụ were sijie na-ebelata mmekọta mmadụ na anwụnta
Ịgba ọnwụ anwụ bụ ịgba ọgwụ anwụ n'ime ụlọ nakwa gburugburu otu ugboro maọbụ ugboro abụọ n'afọ.
E nwere ike igbochi ịba site na inye ndị njem,ụmụnwaanyị dị ime nakwa ụmụaka ọgwụ ịba.
Nyocha nakwa ọgwụgwọ
Ebe foto si, Getty Images
Nyocha nakwa ọgwụgwọ n'egbughị oge bụ ụzọ kacha mma iso ọrịa ịbaIme n
A na-agwọ ịba agwọ- I nwere ike inweta mpụtara nyocha ịba n'nkeji 30 site na nyocha pụrụ iche(microscopy maọbụ rapid diagnostic test).
Dịka WHO siri kwuo, ịchọcha nakwa ọgwụgwọ ịba na-egbochi ọnwụ ma na-ebelata ikesa ọrịa ahụ.
Ọgwụ kachasị arụ ọrụ n'ịgwọ ịba nke plasmodium falciparum butere bụ ọgwụ atinyere artemisinin dị na ya a kpọọ 'artemisinin-based combination therapy' na bekee).
Nsogbu Ọgwụ ịba nakwa ọgwụ anwụ arụzịghị ọrụ
Ebe foto si, Getty Images
Ọ dị mkpa inyocha ọbara a mịtara maka ịba
WHO dọọ aka na ntị na anwụnta 'Anopheles' naghị anabatazị ọgwụ na ọgwụanwụ- nke a na-ewghachi ọganihu e nwerela na ọgụ megiode ịba azụ.
Egwụ na-atụ na ngwa na ụzọ e ji alụso ịba agha ugbua ga-anyụ ka ọkụ.
Ozi sị na nchọpụta WHO maka bịba gosiri na ọgwụanwụ ise a ma ama anaghị arụzi ọrụ na mba 68 bido n'afọ 2010-2017.
Nsogbu ọgwụ ịba arụghị ọrụ bụ nsogbu ka dị ire.
WHO sị na ịgba mbọ hụ n'ọgwụ na-arụ ọrụ bụ ide ji mgbochi na imebila ọrịa ịba ma na-akpo oku ka anya dị n'ihe ndị a.
Nke a bụ iji hụ na a chọpụtara nsogbu ọgwụ arụghị ọrụ ngwangwa ozigbo ozigbo.