New Passport: Gọọmentị ebidola ikesa akwụkwọ njem ọhụrụ

Akwụkwọ ikike njem Naịjirịa Image copyright Nigeria Immigration Service

Ngalaba na-ahụ maka njem na Naịjirịa ebidola ikesa akwụkwọ njem ọhụrụ nke ga-anọru afọ iri.

Onye ọbụla chọrọ akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-eweta akara njirimara ya nke bụ National Identity Number na Bekee.

Ihe ọzọ ga-adị iche n'akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-abụ ego ole ọ dara.

Ọ ga-esi na otu narị dọla gbalite rue narị dọlla abụọ na iri atọ dịka ngalaba NIS siri kwuo.

Akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-eme ka ndị Naịjirịa na-aga njem kwụsị ịnweta nke ọhụrụ kwa afọ ise.

Onyeisiala etinyela ọnụ n'okwu Zainab Aliyu

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola ka ndị aka ha dị n'ihe gbaa mbọ hụ na akpọlatara Zainab Aliyu.

Zainab Aliyu bụ nwata nwaanyị Naịjirịa eboro ebubo na o bụ ọgwụ ike bata na mba Sawụdi Arabịa.

Ozi a si n'akara Twitter nke Bashir Ahmad bụ onye enyemaka onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi.

Ikpe ịbubata ọgwụ ike na mba Sawụdị Arabịa bụ ikpe ọnwụ.

Gee Nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Anụ kanda adịgboroja

Image copyright @thewilling/twitter

Gọọmentị Legọs adọọla ndị mmadụ aka na ntị banyere ụdị kanda adịgboroja nọ n'ime ahịa ugbua nke bu nsi n'ime ya.

Gọọmenti kwuru na ha anwụchiela mmadụ atọ aka ha dị n'ire ụdị kanda na-egbu egbu na mpaghara Okpuru Ọchịchị obodo Ojo na Iba ma kpachi kwa anụ ha ji.

Kọmishịọna na-ahụ maka ahụike na steeti legọs bụ Jide Idris kwuru na ndị a na-ere anụ n'elekere anọ rue elekere isii nke ụtụtụ.

Idris dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachara anya tupu ha azụọ ma ọ bụ rie anụ kanda ma mee kpesa banyere ụdị kanda adịgboroja ọbụla ha hụrụ.

Atọhapụla ndị Chaịna atọọrọ n'Ebonyi Steeti

Image copyright AFP

A tọhapụla ndị mba Chaịna abụọ atọọrọ n'Ebonyi Steeti n'ụbọchị Wednezde izuụka gara aga mgbe ha na-arụrụ gọọmentị Ebonyi Steeti ọrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Oda kwuru na ọ bụ ndị uweojii zọpụtara ndị na-enweghi ọkọ ọbụla kọrọ ha n'ahụ.

Loveth kwuru na ndị ntọrị a gbahapụrụ ha n'ime ọhịa dị n'akụkụ ebe a tọọrọ ha n'ihi ọkụ ndị uweojii na-akwa ha n'ike.

N'aka nke ọzọ ndị ntọ tọọrọ mmadụ atọ na-arụ n'ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na Rivers Steeti n'ụbọchi Satọde.

Ndị a atọọrọ gụnyere ụmụafọ Canada, Naịjirịa na Scotland.

N'ofesi

Image copyright AFP

Pati na-achị na Spain enwela mmeri na ntuliaka mba ahụ mere ụnyaahụ.

Nke a ga-enye aka na-achị Spain bụ Pedro Sanchez na pati abụọ ohere ọzọ inwe nkwọrịta ihazi gọọmentị ọhụrụ.

N'akụkọ ọzọ

Image copyright Getty Images

Ihe onyonyo Avengers: Endgame abụrụla ihe nkiri kachasị kpata ego na mmepe ya dịka oritere otu ijeri dọla na ọma abụọ.

Ihe nkiri a ji abalị ise kpata ego a.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAbakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a