2019 Budget: Ụlọomeiwu ebinyela aka na bọjetị $29.3bn

Onyeisi ụlọomeiwu Bukola Saraki Image copyright @NGRSenate/Twitter

Ego niile gọọmentị ga-emefu pụtara nde dọlla iri abụọ na itoolu ($29.3b) dịka akwụkwọ mkpata na mmefu ahụ kwuru.

Ụlọomeiwu ukwu tinyesoro ego n'ego nke gọọmentị etiti kewapụtara a ga-eji rụ ọrụ na Naịjirịa n'afọ 2019.

Ụlọomeiwu nta ga-ebinye aka na ya bụ akwụkwọ bọjetị tupu o nwee ike ghọrọ iwu na ala Naịjirịa.

Na mba ofesi

Mba Venezuela yiri ọgbọ gụ ugbua dịka igwe mmadụ dapụtara ngagharị iwe.

Image copyright AFP

O bidoro dịka onye anọghị n'ọchịchị bụ Juan Guaido kpọro oku ka ndị mmadụ pụta mee ya bụ ngagharị iwe.

Ndịagha na ndị mmadụ nkịtị kwatara ya n'isiobodo mba ahụ bụ Caracas.

Gọọmentị mba ahụ ekwuola na ha na-agba mbọ apịatụ ya bụ ọnwụnwa ịchutu onyeisiala Nicholas Maduro n'ọkwa.

Image copyright Getty Images

Na mba Spen...

A họpụtala Luc Andre Diouf bụ onye mba Senbegal dịka onye mbụ si mba ya ga-anọchi anya ndị mba Spen n'ụlọomeiwu ukwu ha.

Ọ ga-anọchita anya obodo Las Palmas n'okpuru Socialist Party na mba Spen.

Chukwueze a ga-aza oku Naịjirịa?

Image copyright Getty Images

Dịka a na-akwado iko mba ụwa na mba Poland, Samuel Chukweze bụ onye ọgba bọọlụ Villareal azabeghi oku a kpọrọ ya bịa soro na ndị ga-anọchi anya Naịjirịa.

Onye nkuzi otu obere Naịjirịa U-20 bụ Paul Aigbogun bụ onye kpọrọ ya na ndị ọzọ bịa gbaara Naịjirịa bọọlụ.

Akụkọ BBC Igbo na Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ụgbọoloko akwụpịala ndị mmadụ

Image copyright Getty Images

Ihe ruru mmadụ anọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọoloko dịka ụgbọoloko kwọpịara ọgbatumtum keke n'isi ụtụtụ Tuzde 30 Eprelụ afọ 2019.

Mkpamkpa a mere dịka ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke ụtụtụ n'ebe akpọrọ Iju Ishaga dị n'ime Legọs.

Akụkọ kwuru na ọgbatumtum keke a bu ndị mmadụ chọrọ ịgbafe n'okporo ụgbọoloko mgbe ọ tọọrọ ma ụgbọoloko a akwụpịasa ya.

Akụkọ na-abịa n'uju.

Ndịgbo agbawala ọsọ onyeisiala 2023?

Image copyright Amarachi Atama

Ụmụ Igbo azọpụla njem iji hụ na ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023 agaghị abụ ihe akụkọ nyere ha.

Njem a kpọrọ "Southeast for President 2023 Movement" bụ nke ọtụtụ otu nọ n'ala Igbo jikọtara aka ọnụ hiwe, ga-amalite ọrụ taa n'Enugwu steeti.

Ndị nọ n'ime otu a gụnyere ndị gụrụ ezi akwụkwọ, ndị azụmaahịa, ndị ndu okpukperechi, nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ihe mere ha ji ehiwe otu a bụ ka a hụ na Ndigbo nwere otu mkpebi n'ihe gbasara ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 agbanyeghi pati onye ahụ nọ.

PDP na-arụ Inec aka ebubo

Image copyright @atiku/Twitter

Pati PDP na ụlọọrụ Inec na-atụ onwe ha aka n'ihu dịka PDP boro ha ebubo ịgbanwe igwe "Server" Kọmputa iji kpochapụ nrụrụaka ha mere na ntuliaka onyeisiala.

Mana Inec ekwuola na ebubo a achịtaghị aja ọbụla na ọ bụ n'ụlọikpe ka a ga-ama nke bụ eziokwu.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Eze ukwu nke mba Japan bụ Akihito bụ onye gbara afọ iri asatọ na ise, ga-agbatu n'ocheeze taa iji nye nwa ya ohere ọchịchị.

Akihito ga-abụ onyeeze mbụ mere nke a n'ime ihe karịrị afọ narị abụọ, emume a ga-amalite site n'ịchụ aja dị iche iche.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Onye na-agbara Real Salt Lake nke dị na Mba Amerịka bọọlụ bụ Nedum Onuoha, ekwuola na Zlatan Ibrahimovic yiri ya na ọ ga-emerụ ya ahụ n'egwuregwu ha na LA Galaxy gbara.

O kwuru na Ibrahimovic nwere ọnụ ọjọọ na ọ gaghi anabata arịrịọ mgbaghara ọ rịọrọ ya.

Gere akụkọ BBC n'otu Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụnwoke Kenya na-akwụ ụdọ

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a