Abuja Police raid: 'A ga-ata ndị uweojii na-anwụchi ụmụnwaanyị ahụhụ'

Akụkọ kachasị taa

Ndị uweojii asaala oku ngagharịiwe emere n'Abuja

Ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja

Ndị uweojii asaala okwu banyere ngagharịiwe emere n'Abuja n'ụbọchị Satọde maka etu ndị orụ ha ji anwụchịkọ ụmụnwaanyị ndị na-eyi uwe ga-egosi anụahụ ha.

Usman Umar bụ kọmshịọna ndị uweojii n'Abuja kwuru na ha ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa n'Abuja ga-anọ kpaa nkata maka ihe mere eji amwụchi ụmụnwaanyị ndị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwannyí amara ikpe maka mgbere agbọghọ

O kwuru "Anyị amalitela nyocha banyere nke a, anyị ga-ata ndị aka ha dị na ya ahụhụ ruru ha.

Ndị naa-ahụ maka ikike ruru onye pụtara n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja malite ngagharịiwe n'ihi etu ndị uweojii si anwụchịkọ ụmụnwaanyị ndị na-eyi uwe ga-egosi anụahụ ha.

Ha yi uwe dị ojii si na 'Old Parade' dị n'Abuja rue n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja.

N'aka nke ọzọ ndị nchekwa DSS kwuru na ha nwụchie ndị na-eji ahụ ha achọ ego di iri ise na itoolu na Calabar

Onyeisi DSS na Calabar bụ Ilupeju Adebayo kwuru na ndị a anwụchiri n'isi ụtụtụ Satọde karịrị n'ụmụnwaanyị.

Jamb akọwala ihe ji mpụtara ule nke afọ

Image copyright Jamb/webste

Ụlọọrụ Jamb ekwuola na ihe mere ha jiri egbu oge n'iwepụta mpụtara ule nke afọ a bụ n'ihi nyocha tara ọchịchị ha na-eme banyere mpụtara ule a.

Ọnụ na-ekwuru Jamb bụ Fabian Benjamin kwuru nke a n'iji zaa ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-eju banyere ule ahụ.

N'ofesi

Image copyright EPA

Mba Isreal na ndị na-eyi ndụ egwu na mba Palestine kwarịtara onwe ha mgbọ nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-agba ọsọ izendụ

Otu onye Palentine nwụrụ ebe ndị Isreal abụọ merụrụ ahụ n'ihi nke a.

N'egwuregwu

Otu ndị na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ gụnyere FIFA na NFF akwanyerela onye na-agbara Naịjirịa bọọlụ bụ Rashidi Yekini ugwu na ncheta ubọchị ọnwụ ya.

Rashidi Yekini, nwụrụ n'abalị anọ nke ọnwa Mee afọ 2012 bụ onye kachasị enye goolu na Naịjirịa.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha

"Operation Puff Adder" n'Enugwu

Operation Puff Adder ndị Uweojii amịtawala mkpụrụ n'Enugwu.Commishịọna ndị Uweojii n'Enugwu bụ Sulaiman Balarabe egosiputala ndị oji-egbe ezu mmadụ asaa ndị uweojii gbanụ gbanụ bụ puff Adder jidere n'Enugwu.

Ndị ejidere n'Udị gunyere Chibuike Charles onye udi, Okwudili Uzochi onye Ezeagu, na Mike Chibuode onye Amagunze.

Anwụdere ha ka ha ji egbe anapụ ndị mmadụ ihe n'Udi.

Ọ kpụpụtakwara ndị uweojii mmadụ anọ bụ ndị otu nzuzo Aiyes nke na enye nsogbu na mpaghara Enugwu.

Komishịọna Balarabe kwere ndị Enugwu nkwa na Operation Puff Adder ahụ Onyeisi ndị uweojii bidoro izu uka ole ma ole gara aga bụ nke a ga eji kpochapụ ndị ohi n'Enugwu.

Onyeisiala Buhari ga-alọta ka o si kwuo

Image copyright APC Twitter
Nkenke aha onyonyo A na-ele anya na Buhari ga-alọta ozigbo emechara nzụkọ ahụ

Ụlọọrụ onyeisiala agọọala na kepukepu na-efegharị nke gburu na onyeisiala agaghị alọta n'abalị ise nke ọnwa Mee dịka o siri kwuo n'ihi na ọ gara ọgwụgwọ ọrịa nala Briten bụ Ụgha.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Shehu Garba kwuru na akụkọ ahụ bụ ihe ihere ma na asọ nti onyi.

Ụmụ Naijiria na-ajụ ihe onyeisiala gara ime n'ala bekee kembe abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprelụ dịka ọ pụrụ na-edegara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ iji nyefe ọchịchị n'aka Osote ya bụ Yemi Osinbajo.

Ha na-ajụkwa maọbụ ego gọọmenti ka ọ bụ ego akpa ya ka o jiri gaa njem ahụ dịka o kwuru na ọ bụghị ihe gbara ọchịchị ka ọ gara njem ahụ.

Mana ndị ụlọọrụ ya kwuru na dịka ọ gafeghị abalị iri abụọ na otu, na ọdaghị iwu.

Garba kwuru na onyeisiala nwere ikike si ebe ọbụla na-achị.

Akụkọ gbasara Iyaloja Kọmputa Village

Image copyright Getty Images

Onye odeakwụkwọ otu jikọtara ndị na-ere akụrụngwa kọmputa n'ahịa Computer Village Legọs bụ Jerry Mba ekwuola na atụmatụ inye ha Iyaloja na Babloja bụ ụzọ ndị ala ahụ chọrọ iji kpachapụ Ndigbo ịbụ

ndị isi ahịa ahụ.

Ọrịa otoro na Mozambique

Image copyright European Photopress Agency
Nkenke aha onyonyo Ebe a na-atụ ụmụaka ọgwụ mgbochi maka otoro na Mozambique

N'ofesi, ọrịa otoro apụtala na Mozambique bụ ebe o jiderala mmadụ iri na anọ na obodo iri na otu na mba ahụ.

Nke a mere ka ajọọ ikuku na idemmiri a kpọrọ Cyclone Kenneth kpachara mkpamkpa na mba ahụ.

Caster Semenya sị na onweghị ihe pụrụ igbochi ya n'ọso

Image copyright European Photopress Agency
Nkenke aha onyonyo Caster Semenya bụ nwaanyị dịka nwoke

N'egwuruegwu, nwaada na-agbara mba South Africa ọsọ bụ Caster Semenya ekwuola na ọ bụ naanị olisa bị n'igwe ga-akwụsili ya ịgba ọsọ.

Semenya kwuru nke a ka e merichere ya ka ọ kpụrụ IAAF n'ụlọikpe maka iweda ogogo mmiri ahụ nwoke akpọrọ testosterone na ahụ ụmụnwaanyị na-agba ọsọ.

A na-eche na ike Semenya karịri ike ụmụnwanyị ibe ya bụ nke mere o ji akpagbu ha n'ọsọ mgbe niile.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a