Ọ bụrụ m bụ onyeisiala, a kara m iritu n'ọkwa - Onaiyekan

Cardinal John Onaiyekan Image copyright Getty Images

Archibishop ụlọụka Katọlịk dị n'Abuja kwuru nke a ma gbarụọ ihu kwuo na ndị ọchịchị emeela ka Naịjirịa bụrụ mba ndị mmadụ achọghị ịnọzi na ya

O kwukwara na nke a kpatara na ụmụ ntorobia na-agbaga mba Yurop n'ụzọ ezighi ezi.

Onye ga-azọpụta otu Man U?

Image copyright AFP

Ka ọ dị ugbua, Manchester United enweghi ebe ha ji azụ aga gbasara ibanye n'ogogo ndị nọ n'ọkwa otu ruo anọ na tebulu Premier League.

Huddersfield gbara mbọ hụ na ha tinyere Man Utd n'ọnọdụ "gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma".

Scott McTominay nke Man Utd bu ụzọ kpaa ike ka o nyere goolu na nkeji asatọ e ji malite asọmpi a.

Mana Isaac Mbenza nke Huddersfield gbajiri nku ha ji na-efe ka ọ gbanyere goolu ha ji saa ya na nkeji 60 nke ọkara nke abụọ.

Ntu a Huddersfield kpọrọ ha pụtara Man Utd agaghị eso ndị ga-agba na Champions League nke afọ na-abịa.

Gịnị na-esere Umahi, Nwodo na IPOB?

Otu IPOB akatọọla aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi nakwa onyeisi Ohaneze Ndị Igbo bụ Ogbonnia Nwodo.

Ha mere nke a dịka Nwodo na Umahi gọrọ aka na ụkwụ ha n'iwu Ipob nyere sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Peter Obi na okwu ya gbasara ọdịnịhu Naịjirịa

Image copyright AFP

Onye zọrọ oche osote onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Peter Obi ekwuputela ụjọ ya gbasara ọdịnịhụ Naịjirịa.

Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasa ozi Sun nke Naịjirịa nwere, Obi tụtara alọ etu NaịJirịa ga-esi gbanahụ nsogbu enweghị ọrụ ,iji ụgwọ nakwa ime ka ego ana-amapụta maka nchekwa obodo ghara ịla niyi.

Egwu chị ọkụ asọmpị Premier League taa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Manchester united na Huddersfield ga-achịpụ ya taa n'elekere abụọ nke ehihie

Asọmpị Premier League ka chi ọkụ dịka otu egwuregwu Chelsea nakwa Watford ga-achịpụ ya n'ụbọchị may 5 bụ taa n'ọgbọ egwuregwu Stamford bridge.

Huddersfield na man utd ga-ama aka n'elekere abụọ nke ehihie n'ọdọ egwuregwu John Smith ebe Arsenal na Brighton ga-ma onye ike ga-agwụ n'elekere anọ na ọkara.

Ebubo ndị agha Naịjirịa gbasara May 29

Image copyright Getty Images

Ụfọdụ pati ndọrọndọrọ ọchịchị ha na nke na-achị Naịjiria na-ama aka akatọla etu ndị agha Naịjirịa si pụta kwuo,

na ụfọdụ mmadụ na ndị mba ofesi na-agba mbọ ịhụ na ha ghasasiri mmemme may 29 ga-edubanye onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị nke ugboro abụọ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha naịjirịa bụ Sagir Musa boro pati ndị a ebubo a,

ma kwukwa na ndị mba ofesi chọrọ ibute ọgbaghara n'etiti otu dịka 'Multinational Joint Task Force' na-agbaso ndị omekome dịka Boko Haram mgba.

N'ofesi

Ogbunigwe Israel gburu nne na nwa

Image copyright Rex Features

Ndị agha gaza atụpụla ogbunigwe ruru narị abụọ na mba Israel dịka ndị agha Israel si kwuo.

Nke a butere ntụghachi ogbunigwe na ogige Palestine.

Mgbọ israel ji zaghachi ndị Palestine gburu mmadụ anọ gụnyere nne na nwa dịka ụlọrụ dị na gaza si kwuo.

Nkeji taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha