Liverpool vs Barcelona: Ndị ụka taa dịka otu Barcelona - Fr. Mbaka

Father Mbaka nke Adoration Ministries Image copyright AmenTV/Facebook

Father Mbaka agwala ndị ụka ha ghara ịnọzị chakoo dịka Barca ganye na Liverpool edula ha mmuọ.

O kwuru na asọmpi bọọlụ ahụ kwesịrị ikuzịrị ndị otu kristi ka ha wepu mpako na ndụ ha.

Mbaka kwuru na nke a gosiri ihe akwụkwọ nsọ kwuru na nganga buru ụzọ, ọdịda esoro ya n'azụ,

Nke a bịara n'ekpere ụbọchị Wenezde ọbụla ya bụ "I no dey again" na obi Adoration Umuchigbo, Iji Nike Enugwu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị ụka taa dịka otu Barcelona - Fr. Mbaka

Ọ dọrọ ndị ụka katọliki aka n'nti ka ha ghara ịdị na akatọ ya kama ka ha mara na oge eruola mgbe ụka ga agbanwe.

Ọ gwara ha nabata na ọtụtụ na agbagazị ụka pentecostal maka amụma na ihụ ọhụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka

Mbaka kwuru na agbanyeghị mmekpa ahụ ọbụla na ya ga akachị ntị na ebu amụma, ekpe ekpere, agwọ ọrị na ahụkwa ọhụ.

Na ọ bụ na-aha Chukwu nna, nwa na mụọsọ onye nyere ya onyinye ahụ ka o ji aga.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a