Nigeria Police: Ụzọ ị ga-esi gbalahụ nsogbu na 'checkpọint'

Ọgbatauhie okporoụzọ ndị uweojii Image copyright AFP

Gbasapụ ihu ọchị, nwe ile ụtọ ma gbalahụ ịlụsa onye uweojii ọgụ.

Ihe ndị a bụ azụ ndị uweojii Naijiria na-atụpenye ndị ọkwọụgbọala ma ha zute ọgbatauhie ndị uweojii n'okporoụzọ dịka ha siri wepụta n'igwe okwu Twitter ha.

O doghị anya ihe mere ha ji wepụta ntuziaka ahụ dị 16 , mana ihe onyonyo na-eme ihere nke gosiri onye ọrụ ha ka ọ na-ahụ ọnụ aka azụ ọ ga a nara nwere ike ịbụ ihe butere ya.

N'ihe onyonyo ahụ, onye uweojii ahụ na-ekwu ka enye ya puku naira anọ dịka o kwuru na ego ole onye ahụ kwuru ezughị.

Ụdị ihe dị otu emela ka ha gbagbuo ndị ọkwọụgbọala ndị ekweghị na gọọmentị ha.

Ndị uweojii ekwughị maka ịna akaazụ na "ntuziaka maka ezi mmekorịta n'ọgbataụhie n'okporoụzọ" ahụ mana ha dụrụ ọdụ ka,

"Ka i leruo anya n'aha nakwa akara, ụdị ngwaọgụ nakwa ụdị ụgbọala onye ha bụ ọkachasị ma ọ na-akpa agwa ekwesịghị.

Ọ bụrụ na ịka na-eche otu ị ga-esi gbaso ntụzịaka ndịa, lee ihe ọkwọụgbọala kwesịrị ime:

Welata ọsọ gị dịka ị na-eru nso ọgbataụhie n'okporoụzọ ndị uweojii, gbanye ọkụ dị n'ime ụgbọala gị ma ọ bụụ n'abalị ma dowe aka gị ebe onye uweojii ga na-ahụ ya.

Ịgbalata igwe okwu redio gị ga-adị mma.

Ikụsụ onye uweojii dịka ịsị, 'gbaa mụ' abụghị ezigbo ihe.

Ya na imetụ onye uweojii aka n'ụzọ ekwesịghị ekwesị:

Ndị uweojii kọwapụtara ihe nwere ike iso ịluso onye uweojii ji egbe ọgụ dịka o nwere ike ịgba gị egbe iji chekwa onwe ya:

Ọtụtụ ndị Naijiria enweghị ntụkwasaobi na ebe ndị uweojii nọ n'ihi na ha na-ahụta ha dịka ndị amaghị ọrụ ha nakwa ndị na-eme nrụrụaka dịka onye isi Ụlọọrụ ntakụkọ BBC na Naijiria bụ Aliyu Tanko siri kwuo

Ụmụ Naijiria na-ekwu na ọgbataụhie n'okporoụzọ ndị uweojii karịị akarị ma bụụ ihe ha jị anapụ ndị mmadụ ego akaazụ.

Ndị uweojii Naijiria so na ndị ego ụgwọọnwa ha pekarịchara n'ụwa niile dịụka ha nwekwara nsogbu enweghị ezi ngwaọrụ, dịka onye ntakụkọ anyị siri kwuo.

Mana ndị uweojii na-ahụta nsogbu ha na ọha mmadụ na-enwe dịka ihe nghọtahie na-ebute.

Ha dụrụ ndị mmadụ ọdụ ka were olu ọma na-eso ndị ọrụ ha.:

A na-ahụta ntụzịaka ndịa dịka mbọ ha na-agba iji hụ na e ji anya ọma ele ha.

Nke a na-eso mkparịtaụka ha na ndị mmadụ nwere n'igwe okwu social midia.

Mana ozi ha wepụtara wetara ndị kwere na ndị ekweghị:

  • @Shilorine dụrụ ha ọdụ sị dịka ha wepụtachara ntuziaka ndịa ha kụzịere ndị ọrụ etu ha kwesịị isi na-akpa agwa
  • @rotilaw kwuru na ihe fọrọ n'okwu ahụ bụ ihe ndị uweojii kwesịị ị na-eme ma ha zute ndị nkịtị n'okporoụzọ.
  • @_Tee90papi kwuru na ozi ha wepụtara tụụ ya n'anya ma rịọ ka ha kuzikwara ndị ọrụ ha ihe ha kwesịị ịma.