Mayor of Enfield: Ihe isii Ị maghị maka Kate Anolue bụ 'Mayor' ọhụrụ nke Enfield na mba Briten

Kate Anolue Image copyright Enfield Council

A họpụtala Ada igbo dịka 'Mayo nke Enfield na mba Briten.

Nke a na-eme izu ole na ole nwafọ Igbo ọzọ bụ Ernest Ezeajụghị bụchara 'Mayor' nke Brent.

Dịka Kaụnsul Enfield siri wepụta n'websait, Kate Anolue na ndị imeobi ya ga-anọ n'ọkwa ọchịchị ahụ afọ 2019/20.

Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ezi ozi ekele maka nturuugo ahụ.

Otu APC na London kelere ya maka ibulie aha Naijiria elu n'ofesi nakwa maka ịbụ nwaanyị isi ojii mbụ a ga-eme 'Mayor' na mba Briten.

@UchePOkoye sị na nwa afọ Anambra ọzọ etuterela Nigeria ugo na mba ofesi.

Ihe ndị ịmaghị maka Kate Anolue

1. Anolue bụ nwafọ Nanka n'Anambra steeti

2. Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka

3. 'Ada Jere mba turu ugo' bụkwa onye 'midwife' nwetarala ọtụtụ nzere na Naijiria nakwa na mba ofesi

4. Anolue gara ebido ụwa ya dịka onye nkuzi mana Agha Biafra bụ ihe kwụsịrị ọzụzụ ya dịka onye nkuzi na Teachers Training College.

5. Ọ bụ onye anaghị ahụ mmanya ọkụ ma sorokwa n'otu ndị kweneyere na anaghị edetụ mmanya ọkụ ire bido oge ọ dị afọ 18

6. Anolue arụbuola dịka 'Mayor' of Enfield n'afọ 2012/13

Akụkọ ga-amasi gị: