Tunde Bakare: Onye ji Miyetti Allah tụnyere Ọhaneze na Afenifere ejighi uche ya

Akụkọ dị mkpa taa:

Onye ji Miyetti Allah tụnyere haneze na Afenifere ejighị uche ya- Bakare

Tunde Bakare Image copyright Getty Images

Pastọ Tunde Bakare, onyeisi ụka Latter Rain Assembly ekwuola na iji Miyetti Allah tụnyere Ọhaneze maọbụ Afenifere bụ 'ihe ihere.'

Cheta na n'izu gara aga, ọnụ na-ekwuru onyeisislala Muhammadu Buhari nọọ nmkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels kwuo na Miyetti na Allah na Ọhaneze na Afeniferi bu otu ihe.

Bakare kwuru nke o ge o na-ezi ozi ọma n'ụlọụka ya kwuru na ihe kacha mee ya ihe ihere bụ na onye kwuru ya bụ okwu gụpụrụ 'Arewa Consultative Forum bu otu na-anochite ndị Ugwu.

"Ọ bụ ihe ihere na mmadụ ji Miyetti Allah tụnyere Afenifere. Onye siri na Miyetti Allah na Afenifere na Ohaneze bu otu ihe bụ onye ejighị uche ya."

"Kedu ka ị ga-asị na otu United Nation kporo otu nwere ogogo anọ ndị kachasị egbu mmadụ na Afenifere bu otu?"

"Kedụ ka otu na-egbusi ndị mmadụ, wakpo ụmụnwaanyị , mebie ụlọ ndị mmadụ na Afenifere siri buru otu? Afenifere ọ na-ebu ngwaọgụ?"

Bakare kwuru na ụlọrụ onyeisiala ịhapụ ịkpọta aha Afrewa Consultative Forum bụ ihe e doro anya mee.

Bakare gara n'ihu kwuo na ndị ohi, ndị omekome ndị ohi ehi nakwa ndị ochiehi egbu isi na-akpazi ike na Naijiria dịka ha bụzị ọchịagha(commander-in-chief) ala Naijiria.

Gọvanọ Okezie Ikpeazu ekposala ndị obi ọchịchị ya

Gọvanọ Ikpeazu meriri na ntuliaka afọ 2019 iji chịa afọ anọ ọzọ Image copyright Abia State Government

Gọvanọ na-achị Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekposala ndị obi ọchịchị ya dịka ọ na-akwado ịba n'agba nke abụọ ọchịchị n'ụbọchị ole na ole na-abịa.

Mana ọ bụghị ha niile ka ọ kwụsịrị ọrụ.

Ndị ga-eso ya gaa n'ihu ịrụ ọrụ gụnyere:

Eziuche Ubani bụ kọmishịọna na-ahụ maka ọrụ

John Okiyi Kalu bụ nke mgbasaozi

Aham Uko bụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi

Obinna Oriaku bụ kọmishịọna na-ahụ maka ego

John Ahukannah bụ nke ahụike

na Ume Kalu bụ ọkaikpe ukwu nke Steeti ahụ.

N'ozi si n'aka odeakwụkwọ mgbasa ozi ya pụta, gọvanọ Ikpeazu kelere ndị a maka ọrụ ọma ha rụrụ ya nakwa Steeti ma gwa ha nyefe ihe niile ha ji rụọ ọrụ n'aka ndị ọdeakwụkwọ ukwu mịnịstrị ha.

Ụlọọrụ akwụkwọ njem ala Amerika Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amerika were udi ụlọọrụ a n' Abuja na Lagos

Ụlọọrụ nnọchịte mba Amerịlka na Naijiria ekwuola na onye ọbụla chọrọ akwụkwọ ịba mba ahụ ga-abịa maka ajụjụọnụ n'agbanyeghị na e nyebuola ya akwụkwọ mbụ.

N'ozi ha wepụtara na websait ha, Ha kwuru na 'Bido na Tuzde, Abali iri na anọ nke ọnwa Mee, afọ 2019, ụlọrụ nnochite Amerịka na Naijiria na akwụsị ịgba ajụjụ ọnụ maka ndị chọọ inwoghari akwụkwọ ikike ịbanye Amerịka nke a mara dịka usoro 'Dropbox'."

Mana ha gbara ama na ndị ziterala akwụkwọ ha site na ụlọọrụ na-ekesa akwụkwọ ozi a kpọrọ DHL n'Abuja maọbụ na Legos ndị nke ha ruterela ha aka.

Na mbụ, ndị nweburu akwụkwọ ikike ịga-mba Amerịka na-ezigara ụlọọrụ akwụkwọ ịrịọ maka nnwogharị site ụlọọrụ na-ekesa akwụkwọ ozi dịka anaghị agba ha ajụjụ ọnụ tupu ha enweta nke ọhụụ ọzọ.

Kpọpụtanụ Leah Sheribu - Gọv Hassan Dankwambo

Image copyright TheCable

Dịka taa bụ ncheta afọ iri na isii a mụrụ Leah Sharibu bụ nwata nwaanyị ndị Boko Haram tọọrọ kemgbe otu afọ gara aga.

Gọvanọ Gombe Steeti bụ Ibrahim Hassan Dankwambo akpọọla oku ka a tọhapụ nwata ngwangwa site n'aka Boko Haram.

N'ofesi

Image copyright Reuters

Mba Amerịka na-arụ mba Ịran aka n'ihu na ọ bụ ha ji ogbunigwe mebie ụgbọmmiri anọ na mpaghara United Arab Emirates n'ụbọchị ụka.

o nwebeghi ihe akaebe na-egosi na aka ndị Ịran dị n'aya mana mba ndị ometụtara a tabeghi onwe ụta.

N'egwuregwu

Image copyright AFP

Manchester City nọzi n'ọnụ ọnya ndị Uefa ugbua dịka a na-enyocha ha maka ebubo ịda iwu gbasara ego na-achị otu egwuregwu bọọlụ.

A ga-amachi ha ịgba asọmpị Champịọns league otu afọ ma ọ bụrụ na chọpụta na ha dara iwu a n'ezie.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'

Whatsapp sị gị zụta ekwentị ọhụrụ iji gbalahụ nje ekwentị

Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ Facebook nwe Whatsapp ekwuola na ndị mmadụ akpọbeghi aha awakpoola ekwentị ụfọdụ mmadụ

Ha kwuru na ha ga-ezigara ndị ahụ ozi sị ha gbanwee Whatsapp nke dị n'ekwentị ha.

Ha kwukwara na ndị ji ekwentị "Windows" ga-agbanwe nke ha iji gbalahụ ya bụ nje.

Kedụ etu ị ga-esi gbanwe Whatsapp gị?

  • Gaa na 'Google Play store'
  • Mepee Menu n'aka ekpe ekwentị gị
  • Mepee "My Apps and Games"
  • Ị ga-ahụ ebe o kwuru "Update me", pịa ya aka ịnweta nke ọhụrụ.
  • Nke ọhụrụ n'Android bụ 2.19.134

Na iOS

  • Mepee "App Store"
  • N'okpuru ekwentị ebe ahụ pịa "Updates"
  • Ị ga-ahụ ebe o kwuru "Update me", pịa ya aka ịnweta nke ọhụrụ.
  • Nke ọhụrụ na iOS bụ 2.19.51

Onye kpụpụrụ onyesisiala ụlọikpe?

Image copyright Twitter/@NGRPresident
Nkenke aha onyonyo Tanko na Justice fo di nation's Supreme Court

Onyeisiala Muhammadu Buhari na onye ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bu Abubakar Malami jụrụ ịpụta n'ụlọikpe izara ọnụ ha.

Okwu na-eche ha gbasara ọkwa ọkaikpe kachasị nke onyeisiala nyefere n'aka Tanko Mohammed.

Akụkọ kwuru na o nweghi kwa ndị ọkaiwu nọchitere anya onyeisiala n'ụlọikpe ahụ.

"Obi ọjọọ ka e ji kwatu Caramelo"

Image copyright DooshimaAbu/Twitter

Gọọmenti Abuja akwatuola ụlọ oriri na nkwarị a ma ama bụ Caramelo n'Abuja n'ụbọchị Monde.

Ha kwuru na ọ bụ maka mkpọtu si ebe ahụ apụta ka ha ji kwatuo ya

Ebe onye ọkaiwu bụ Goddy Uwazurike nke BBC kpọrọ n'ekwentị na-akọwa na ọ bụ obi ọjọọ ka gọọmentị Abuja jiri kwatuo ya bụ ụlọ.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Dịka a na-ege ntị ịnụ aha ndị Gernot Rohr ga-akpọpụta ga-agbara Naịjirịa n'asọmpị iko mba Afrịka, a na-atụ anya na Mikel Obi ga-eso na ya.

Cheta na ahụbeghị Mikel Obi anya kemgbe Argentina meriri Naịjirịa n'asọmpị iko mba ụwa afọ gara aga.

Gee Nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAgriculture in Nigeria: 'Eji m ọrụ ugbo achụ ụbịam na agụụ ọsọ ụkwụ erughi ala'