Imo State: Ejighi m 'mace' gbaa ọsọ - Acho Ihim

E bughi m ọkwa ụlọomeiwu gbapụ Image copyright @NGN Senate/Facebook

Ndị omeiwu iri abụọ na asaa nke ụlọomeiwu Imo Steeti akwụsịla onyeisi ha bụ Acho Ihim ọrụ n'ihi ibuli mmachị ha machiri ndị isioche okpụrụọchịchị obodo.

Ha kwuru na o buliri mmachi a na-emeghi ka ha mara ma buru kwa ọffọr na-achị ndị ulọomeiwu pụọ.

Ndị ụlọomeiwu mmadụ iri abụọ na otu họpụtara Chiendu Offor nke pati Action Alliance dịka onye ga-anọchị anya Acho Ihim.

Ha gara n'ihu chụtuo onye ndu ndị ụlọomeiwu bụ Lugard Osuji ma were Lloyd Chukwuemeka nke Owerri North dochie anya ya.

Mana Acho Ihim bụ onye so Uche Nwosu zọọ ọkwa dịka osote gọvanọ Imo Steeti gwara BBC Igbo na mkpebi a ha mere n'azụ na-abụghị n'ime ụlọomeiwu enweghi isi ọbụla

O kwuru na adeakwụkwọ ụlọomeiwu anọghị ebe ahụ gụnyere na ọffọr na-achị ụlọomeiwu adịghị mgbe ha mere mkpebi a.

Ihim kwuru na akwụkwọ ọ gụpụtara bụ mkpebi ndị isi kọmitee ụlọomeiwu nwere n'etiti dịka iwu ji kwado.

O kwuru na ha ga-emezi nghọtaghe a n'ihi na ha bụ ndị nke ya, na onweghi oke nsogbu dị na ya.

Onyeisiala Buhari agala njem na Saudi Arabia

Image copyright Facebook/Femi Adesina

Onyeisiala Buhari a nabatala ọkpụkpọ oku eze mba Saudi Arabia bụ Salman Bin Abdulaziz kpọrọ ya maka ime njem ala nsọ a kpọrọ Umrah na mba ahụ.

Nke a pụtara na Buhari na ndị enyemaka ya ga-azọpụ njem na Tọsde bụ abalị iri na isii ọnwa dịka a ga-atụ anya mbata ya n'abalị iri abụọ na otu.

Na Sudan

Image copyright AFP

Ndịagha mba Sudan ekwupụtala nkwekọrịta ha na ndị ọchịchị na-ama ha aka n'ihu nwere inyefe ndị obodo ọchịchị n'ime afọ atọ na-abịa

Cheta na ndị agha were ọchịchị na mba ahụ n'ọnwa gara aga mgbe ha chuturu onyeisiala ha bụ Omar al-Bashir.

N'egwuregwu

Akatọọla Man City maka iwepụta ihe onyonyo ebe ndị ọgba bọọlụ na ndị ọrụ ha na-ekwe n'aka ụdị na-egosi ebe e tiri ndị nkwado Liverpool ihe.

Mana a matabeghi ndị ọgba bọọlụ na ndị ọrụ ha nọ n'ihe onyonyo ahụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'

APGA achụpụla Obiano na Bianca n'isi ọchịchị ha

Image copyright Bianca Odumegwu Ojukwu Facebook

Dịka APGA na-akwado ime ọgbakọ imeụlọ ha na-abịa na ngwụcha ọnwa a, ha ekposaala otu "Board of Trustees" ha.

Ndị otu BOT APGA gụnyere gọvanọ na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano, Bianca Ojukwu nakwa Victor Umeh.

Odeakwụkwọ pati ahụ bụ Labaran Maku kwuru na pati ha kpebiri ime nke a oge ha zụkọrọ n'Awka makana oge afọ anọ ndị otu BOT ha ji achị ezuola.

Image copyright Getty Images

Nne nwata nwoke aha ya bụ Ekene Ezenala kachasị mee ọfụma n'ule Jamb akpọkuola gọọmenti etiti nakwa ndị iheọma na-emetụ n'obi ka ha manye ọnụ n'ihe gbasara afọ ole nwataakwụkwọ kwesiri ịdị tupu

ọ banye Mahadum.

Ihe Oriakụ Ezenala amaghị bụ na ọnụ na-ekwuru UNILAG bụ Salau Tajudeen gwara onye ntaakụkọ BBC na Ekene ga nwaleriri ule ha, mee ọfụma tupu ekwuwe okwu ịnabata ya na Mahadum ha.

Image copyright Facebook

Ụlọikpe akwụsịla ụlọrụ gọmenti etiti, EFCC ,DSS, Uweojii,CCT, ịgba onyeisi senate bụ Bukola Saraki ajụjụ ọnụ gbasara mpụ na nrụrụaka.

Saraki degara ụlọikpe akwkwọ abụọ iji ma aka maka mkpebi Efcc igbachi ụlọ ya karịrị otu.

N'Egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Italian Open nke afọ 2019 ga-akwa ome egwuregwu tennis akpọrọ Serena williams.

Williams onye kwuru na ọ ga-esonyeriri egwuregwu nke French Open kwuru na ugbua ọ na-elekọta ọnya mere ya n'ikpere.

N'ofesi,

Nkenke aha onyonyo Iwu a emenyeghịrị ndị awakporo n'ike

Obodo Alabama dị na mba Amerika ewepụtala iwu ga-akwụsị ikekpa afọ ime n'obodo ahụ.

Gọvanọ na-achị obodo ahụ ebinyebeghị aka n'akwụkwọ iwu ahụ mana ụfọdụ ụmụnwaanyị akatọla ya bụ atụmaatụ.

Nkeji taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a