Thailand: Nkịta zọro nwa ọhụrụ e liri na ndụ

Nwa ọhụrụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ nkịta mere ihe onye nwe ya ji chọpụta nwa ọhụrụ ahụ.

A na-ekwu na nkịta nyara akpa nsi agwụ n'ọhịa .

Mana otu nkịta nọ na Thailand eme na ihe a ga-eji tuo nkịta ugo na mba ụwa niile.

Akụkọ kwuru na nkịta a zọrọ ndụ nwa ọhụrụ mama ya dị afọ iri na ise liri na ndụ n'otu ama na mba ahụ.

Nne nwa ahụ liri nwa ahụ na ndụ makana ọ chọghị ka nne na nna ya mara na ọtụtara ime nkpuke.

Kedụ ka nkịta si zọpụta nwa ọhụrụ ahụ?

Nkịta a aha ya bụ Ping pong bia na-agbọ ụja ma na-egwu ana.

Onye nwe ya wee chọpụta ụkwụ nwa na-agba tịka tịka n'ana ebe abụ Ping Pong na-egwu.

Ndị agbataobi kpọọrọ nwa ọhụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ ebe ndị dịbia bekee kwuru na nwa ahụ dị Sam.

Akpụpụla nne nwa ọhụrụ ahụ n'ụlọikpe mana nne na nna ya kwuru na ha ga-elekọta nwa ahụ ọmụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: