Mental Health Awareness: Ihe na-ebute ọrịa echiche na ụzọ a ga-eji gwọọ ya

Ọrịa uche nke a na-akpọ 'Mental illness' na bekee bụ dịka ndị ọkanmụta na-ahụike si kwuo na ọ bụ nsogbu dị n'etu mmadụ si akpa agwa maọbụ eche uche.

Ndị tinyere ọnụ na mkparịta ụka a gụnyere nwada Orjinta Nancy Kelechukwu bụ onye ọrụ ahụike n'ụlọọgwụ 'Psychiatric' na Izuchukwu Akawuchim bụ nwa akwụkwọ Mahadum.

Ihe ndị ha rụtụrụ aka gụnyere

1 Etu ọnọdụ ọrịa echiche dị na Naịjirịa ugbua

Nwada Nancy Kelechuru na ọnọdụ ọrịa echiche na Naịjirịa dịka etu ọ dị na mba ndị ọzọ gbaa gburugburu, na mmadụ iri na anọ n'ime mmadụ otu narị na-arịa ọrịa echiche otu ma ọ bụ ọzọ na Naịjirịa.

O kwuru n'agbanyeghi na ndị dọkịta na-agwọ ọrịa echiche dị obere na a tụnyere ha mmadụ ole nọ na Naịjirịa, ndị mmadụ anaghị aga ụlọọgwụ gaa chọọ ọgwụgwọ n'ihe gbasara ọrịa echiche a.

2 Gịnị na-akpa ọrịa echiche?

Nancy kwuru na e nwere ọtụtụ ihe na-akpata gụnyere ihe si na-agbụrụ ezinaụlọ, mgbe 'Hormeone' ndị dị n'ụbụrụisi nwụrụ, echiche nsogbu dị n'ụwa.

Izuchukwu tụnyere ọnụ na nne na nna nwereike ime ka nsogbu a dakwasị ụmụaka ha n'ihi oke ihe ha na-atụ ha anya n'aka, oke ọchịchị nke ndị ntoroọbịa na ihe ndị ọzọ.

Gịnị ka o nwereike ibute?

Ha kwuru na nke a nwereike ibute, oke echiche, obi ịda mba, mmadụ igbu onwe ya site n'ụzọ dị icheiche.

Kedụ etu e si amata ndị nwere ọrịa echiche?

Ha kwuru na ndị a na-adị akpapụkarị onwe ha iche, na mgbe ụfọdụ ha anaghị ama ihe ha na-eme, uche ha a naghị adị n'ihe ndụ mmadụ na-eme.

Kedụ ihe bụ ụzọ gbapụta?

Nwada Kelechi kwuru na ndị dị etu a kwesiri ị ga n'ụlọọgwụ na-ahụ maka echiche na ụbụrụisi ka e nyocha ma gwọọ ha ọrịa a.

Nke ọzọ bụ ị na-akpaketa ndị a nso, ị gwa ha okwu nkasị obi mana nke kachasị nke bụ ka e nyochaa ha ụbụrụisi ma nye ha ọgwụgwọ zuruoke.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: