Buhari: Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọsọ onyeisiala gbara na Makkah

Buhari Image copyright @BashirAhmaad

Ọtụtụ ndị hụrụ ebe onyeisiala na-agba ọsọ na Makkah kwuru ọtụtụ ihe gosiri na obi dị ha ụtọ na Buhari siri ike nke ịgbakwu ọsọ.

Ihe onyonyo a bụ onye nta akụkọ NTA sere ya gosiri Buhari ebe ọ gbapụrụ ọsọ dịka omenaala ekpere alakụba si nye n'izu a.

Ọtụtụ ndị kwụnyere Buhari kwuru na ọsọ a ọ gbara gosiri na okwu niile na-afegharị maka adịghị ike ya bụ ụgha.

@unclexofficial tinyere ihe onyonyo a n'akara twitter ya ma na-etokwa onyeisiala Buhari.

@aoroh kwuru na ndị mmadụ ekwesịghị iji ihe gbasara okwukwe onye na-ekwu okwu.

@cbngov_akin1 kwuru na nke a gosiri na Buhari dị sam.

Mana ndị a na-ekwu ihe ọzọ.

@Talibkolo1 kwuru naekwesịghị iji ọsọ ahụ tunyere etu Buhari ga-esi hazị akụ na ụba Naịjirịa.

@SenGoodluck rịrịọ ka onyeisiala Buhari kpere ụmụ Naijira ekpere.

Mana o nweghị ihe dị njọ ma ọ bụrụ na onyeisiala bụrụ onye ekpere makana ọ ga na-ekpere obodo ya ekpere.