Etu esi akwado uleakwụkwọ: Ihe ikwesiri ịma

Two students revising Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Dí njikere

Ọ bụrụ na ị na-akwado ụle, ma ịmaghị ebe ị ga ebido ebido ezie, anyị depụtara gị ihe ole maọbụ ole bụ ihe dị ị ga elebere anya nke ga-enyere gị aka ịkpokota echiche gị ma ichetakwa ya bụ ihe ị

gụrụ mgbe ule.

Ihe ndị bụ ihe anyị jụtara ndị ọkamụta dị icheiche ma ụmụakwụkwọ ụbụrụ ha na-anụ ọkụ.

1. Ịgba ụchụ na nrị ụbụrụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nri ntacharu na-adíkwa mma

Makana ụbụrụ gị chọrọ ike ọ ga-etinye n'ọrụ, nrị ụtụtụ di oke mkpa.

Nri dị ka "oat", bredi, milik, akwa, azụ tomatosu, ube Bekee na-adị mma iji gbaa ụchụ ụtụtụ.

Mkpụrụ osisi ndị ọzọ dị iche iche na-adịkwa mma n'ụtụtụ.

2. Malite n'oge kwadowa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bido n'oge kwadowa

Bido ị gụ akwụkwọ n'oge. Echela ka oge gawa tupu ị bido amaka emee ngwangwa emerghara ọdachi

Ọ na-adịkwa mma ị gụ akwụkwọ n'ụtụtụ karịa n'ihihie mgbe anwụ pụtara.

Ọ na-adịkwa mma ịnye oge ị ga-eji agụ akwụkwọ kwa ụbọchị.

Ekwela ka chi folahụ gị ebe ị na-agụ akwụkwọ.

3.Mara ụdị ule ị na-aga

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Know what you'll be facing... and prepare accordingly

Ule ị na-a ga ọ bụ nke edemede, ajụjụ ọnụ ka ọbụ nke ọrụaka?

Ule ọbụla nwere ụzọ esi agụ ya. Ule edemede ekwesighị ka ị gụcha ihe niile asị ka agụọ. Tinye echiche gị n'ole maọbụ ole gụọ ya nke ọma. Ọ bụrụkwanụ ule họrọ otu, ị kwesiri ị gụ karrịa nke a mana ị gaghị agụmị ya agụmị ka nke edemede.

Ọ dị mkpa na ị nwere akwụkwọ gosiri ịhe ịkwesiri ị gụ maka ule ahụ.

4. Hazie usoro agụm akwụkwọ gị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihazie órú gí nke óma, ó ga-enyere gí aka

Depụta usoro agụm akwụkwọ gị na ihe niile ị kwesiri ị gụ. Tinyekwa oge ị ga-eji gwuo egwu maọbụ megharịa ahụ.

5. Onye onwe gị ohere

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kerie ihe í chóró i gú ma gúó wa ya ntakiri ntakri

Akpọdola isi n'akwụkwọ mgbe dum.

Emekwala ka ị bụrụ mkpụrụ akwụkwọ niile n'isi nke Bekee kpọrọ "Cramming", ma ka ahụ ghọta ihe ị na-agụ.

Ịdepụta ihe na mpempe akwụkwọ, ịche echiche maka ihe ị na-agụ, gị na ibe gị ịkpa maka ihe ụnụ gụru, itinye onwe gị na "tape" maọbụ na-ekwwntị mgbe ị na-agụ ya ma kpọọ ya mgbe ị mechere, bụ ụzọ ị ga-esi echeta ihe ị gụrụ.

6. Nye onwe gị ule

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nye onwe gí ule

Ụzọ kacha mma iji mata ma ihe ị gụrụ aka dịkwa bụ itinyere onwe gị ule maọbụ jụọ onwe gị ajụjụ mgbe ị gụchara.

7. Kuziere onye ọzọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ka m gwa gí ihe

Ga kuziere onye ọzọ ihe ị mụtara iji mara ka ị mụtala ya nke ọma.

8. Dowe ekwentị n'ụsọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ekwenti gí bú onye iro gí mgbe í na-agú akwúkwó

Ekwela ka ekwentị gị megharịa gị anya. Dowe ya n'ụsọ mgbe ị na-agụ akwụkwọ.

9. Ejila egwu agụ akwụkwọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nóró ebe daara júú

Nchọpụta gosiri na ndị anaghị eji egwu agụ akwụkwọ ka eche karịa ndị ji egwu agụ.

10.Nwee ezumike kwa mgbe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gagharía oburu dí nkeji iri na ise

Ọ na-adịkwa mkpa ịgwụ egwụ mgbe ị gụchara akwụkwọ ma nara ikuku ndụ. Nke a ga-eme ka akwụkwọ gụọ gị agụ ọzọ.

11. Ụra ndị oke mkpa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rahu ezigbo ụra

Nye onwe gị ezigbo ụra abalị. Emela ka ị gụọ akwụkwọ abalị niile. Tinye oge ị kwesiri iji nakpuo ụra.

12. Dere jụụ ma buru n'uche na ihe niile adịla mma

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Iji ya

Ugbua ị mụtala ihe ị ga-eme ka akọ na uche gị zuo oke bụ nke ndị oka muta mere nchọpụta puru iche onweghị ihe ọfọrọ gị ugbua.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a