Enugwu Airport upgrade: Gọmenti amalitela ịkwatu ahịa Orie Emene
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Akanu Ibiam airport: Gọọmentị amalitela ịkwatu ahịa Orie Emene

Ndị na-azụ ahịa n'Orie Emene Enugwu ji anya mmiri na-ayọ gọmentị Enugwu Steeti ka ọ ghara ịkwatu ahịa ahụ n'ihi na enyeghi ha ebe ọzọ ha ga akwaba.

Gọọmentị wepụtara ozi n'abalị ole na ole gara aga sị na ha ga akwatusi ya bụ nnukwu ahịa n'ihi na ọ nọ n'akụkụ ọdọụgbọelu bụ Akanu Ibiam International Airport Enugwu.

Ịkwadasị ya bụ ahịa amalitelarị ka mgbe Satọde ụbọchị iri na asatọ n'ọnwa Mee, afọ 2019.

Oge BBC Igbo rutere n'ahịa ahụ ụmụnwaanyị na-azụ ahịa n'Orie Emene ahụ zukọrọ n'igwe were anya mmiri akwa rịọ gọọmentị ka ọ kwụsị ya bụ nkụda ahịa.

Ha gwara gọọmentị ha enweghi ebe ọzọ ha ga-anọ zụta ihe ha na ezinaụlọ ha ga-eri.

Ndị na-egbu anụ gọrọ agụgọ na onweghi nnụnnụ ọbụla si ebe ha na-egbu anụ were bee n'ụgbọelụ.

N'ihi na ka mgbe alụrụ agha, ahịa ahụ malitere na onwebeghi onye nụrụ na nnụnụ na ugboelu kwakọrọ isi.

Onye isi ahịa Orie Emene bụ Engr Jimmy-Frank Okonkwo rịọrọ gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi na ndị ogbenye jupụtara n'ahịa.

Okonkwo nakwa ọtụ ndị ahịa ahụ gwara BBC Igbo ka obi sị dịrị ha, wee rịọ gọọmentị ka onye ha ebe ọzọ ha ga ebu ahịa gaa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: