Anambra steeti: Ndị uweojii anwụchiela ndị yi uwe ndị agha Naịjirịa tọrọ mmadụ

Uweojii Nigeria Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti

Ndị uweojii nọ n'Anambra steeti anwụchiela ndị ntọ yi uwe ndị agha Naịjirịa wee tọrọ otu nwoke n'obodo Ekwulobia.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Haruna kwuru na otu n'ime ndị ntọ ahụ bụ onye otu ndị agha Naịjiria ma kwukwa na ha na-enyocha ya bụ mpụ ka ha mara ihe kpatara ya.

SERAP akpụpụla Gọvanọ Delta Ụlọikpe

Image copyright Ifeanyi Okowa/Facebook

Otu na-ahụ maka nhazi akụ na uba obodo akpọrọ SERAP n'ichafụ akpụpụla gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ụlọikpe maka ọnọdụ ọjọ ụlọ akwụkwọ primari dị na steeti ahụ dị.n

Ha chọrọ ka ụlọikpe ukwu nke gọọmenti etiti gwa Okowa ka ọkọwa ihe kpatara ọnọdụ ụlọakwụkwọ ndị ahụ ji dị njọ

N'ofesi,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo A chọpụtara na ụmụnwoke atọ a so n'otu IS

Ụlọikpe dị n'Iraqi amaala ụmụnwoke atọ si mba French ikpe ọnwụ ka ha chọpụtachara na ha so n'otu Islamic State ndị agụnyere dịka ndị omekome.

Ha bụ ndị mbụ a na-eche na ha so n'otu IS amarala ikpe ọnwụ.

Okwu Naịjirịa na IAAF

Image copyright @SolomonDalung
Nkenke aha onyonyo A na-ebo Dalung ebubo na ọ bụ ya kwuru ka ahara ikwụghachi ego ahụ mgbe IAAF kwufere ego

Minista na-ahụ maka egwuregwu na Naijirịa bụ Solomon Dalung agwaala BBC Igbo na agbanyeghị akụkọ na-efegharị gbasara ego 'International Associations of Athletics Federation kwụfere AFN sị dị,

na gọọmenti etiti ga-agbapụtarịrị onwe ya.

O kwuru na nke a bụ maka mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị IAAF.

O kweghị ka onye ntaakụkọ BBC gbacha ya ajụjụ ọnụ dịka ọ pinyuru ekwenti ya.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGburugburu: Ihe anyị ji echeta Gọv Ugwuanyi na nke anyị chọrọ n'aka ya ugbua