Narendra Modi emeriela ntuliaka India

Narendra Modi abụrụla Prime Minista India ọzọ. Image copyright Thinkstock

Akụkọ na-afịọ ugbua na-ekwu na Narendra Modi emeriela ntuliaka n'India na-eleghi anya n'azụ.

Nke a pụtara na Modi ga-achị mba India afọ ise ọzọ.

Mpụtara ntuliaka ha mere na-egosi na pati ya bụ Bharatiya Janata Party (BJP) ji ọnọdụ narị atọ (300) n'ime oche narị iri ise, iri anọ na atọ (543) nke mba ahụ.

Iwu kwuru na onye nwetere vootụ narị abụọ na ụma iri abụọ na asaa (272) ga-enwe mmeri na ntuliaka India.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị nkwado Modi

Pati na-arụ ha ụka nke onyeisi ha bụ Rahul Gandhi nke Congress party ekwetebeghị na ya bụ mmeri.

Atụrụ anya na Pati Gandhi ga-erita oche otu narị(100).

Ihe karịrị mmadụ nde narị isii (600 million) tụrụ votu ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a