Drug abuse: Ịṅụ ọgwụ mgbochi aghara aghara na-eme ka ọ ghara ịrụ ọrụ

Mkpúrú ógwú Image copyright Getty Images

Otu jikọrọ mba ụwa n'ọrụ ahụike bụ WHO ekwuola na ọgwụ mgbochi nje Bekee kpọrọ "antibiotics" ụfọdụ anaghịzị arụ ọrụ ka okwesiri ugbua.

Na mkparịta ụka BBC Igbo na onye ọrụ ahụike bụ Dọkịnta Orhiakhi, o kwupụtara ihe ụfọdụ mere ya bụ ọgwụ ndị a ejighizi arụ ọrụ.

Lee ihe ndị okwuru

  • Ụmụ nje a nwereike ikwechiri n'onwe ha jụ na ọgwụ agaghị arụ ọrụ.
  • Ọ bụrụkwa na onye ọrịa ahụ aṅụghị ya bụ ọgwụ ka o kwesiri, site n'ịṅufe ya n'oke maọbụ ṅụọ ya karịa abalị ole achọrọ ya.
  • Ụfọdụ na-aṅụ ọgwụ mgbochi a mgbe ha ekwesighị ịṅụ ya nke nwekwara ike ime ka ya bụ ogwu kwụsị ịrụ ọrụ n'ọdịnihu.
  • Aṅụzụghị ọgwụ mgbochi a dịka ndị ọrụ ahụike dere ya nwekwaraike ịme ka ọ gharazị ịdị ire.
  • Ihe ndị a na-eme ka ya bụ ọgwụ mara ụmụ nje ahụ ma gharakwa ịrụ ọrụ dịka o kwesiri.
  • Ụbịam sokwa eme na ndị mmadụ na aṅụ ọgwụ ekwesighị maka na ha ejighị ego ha ji aga ụlọọgwụ.

Dịka Oriuiakhi sị kwụọ, "ọ bụ ụdị agwa ọjọ a ụfọdụ na-eme megide ogwu mgbochi mere ogwu ụfọdụ e ji agwọ ịba jiri nwụọ pịị."

Ọ sị na ndị ụfọdụ na-aga na Kemist, gọrọ ọgwụ ndị a na-enweghị ikike n'aka ndị dọkịnta aṅụ ya.

Nke a ga-eme na mgbe ahụ ha chọzịrị ya bụ ọgwụ, ọ gaghịzị arụ ọrụ n'ahụ ha.

O kwukwara na ihe a bụ nsogbụ dịara ọrụ ahụike.

Kedụ ihe a ga-eme ka ọgwụ mgbochi rụọ ọrụ ka o kwesiri?

E kwesiri inye ndị mmadụ ezigbo ọzụzụ maka otu esi aṅụ ọgwụ mgbochi.

Naanị mgbe dọkịnta deerela mmadụ ọgwụ mgbochi ndị a bụ mgbe e kwesiri ịnụ ya.

Ndị na-ere ọgwụ mgbochi ekwesighị iresi ya mmadụ ma onye ahụ ejighị akwụkwọ dọkịnta ya dere.

E kwesikwara ịme nnyocha Bekee kpọrọ "Culture and Sensitivity" tupu enye mmadụ ọgwụ mgbochi.

Onye ahụ adịghị gaa n'ụlọọgwụ ga mee nnyocha ka e wee deere ya ọgwụ kwesiri.

Ndị ọrụahụike kwesiri ịkọwara ndị mmadụ mkpa ọ dị ịmata ka esi aṅụ ọgwụ mgbochi ndị a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a